N’Abuja, ndị bishọp Katọlik mere ngagharị iwe ikwutọ ọnọdụ nchekwa Nigeria

0
211
Ndị Bishọp na ndị ụka mgbe ha na- eme ngagharị ahụ

NDỊ bishọp ụka Katọlik na Nigeria ‘Catholic Bishops’ Conference Nigeria’ (CBCN) na ndị ụka ha emeela ngagharị iwe iji katọọ ọnọdụ gọọmenti Nigeria banyere enweghị ezi nchekwa nke chere aka mgba n’ala anyị ugbu a.

  Na ngagharị iwe ahụ nke e mere ụbọchị ụka n’ụzọ udo, ndị bishọp  na ndị ụka ha yi akwa ojii ma buruchaa ihe e depụtara nke ọma (placards) wee gagharịa n’Abuja.

  Ha kpọrọ oku ka a kwụsị ọnọdụ ọjọọ enweghị ezi nchekwa nke e ji emegide ndị otu Kristi, ọ kachasị na mgbago ugwu (Northern Nigeria).

  Ha mere nke ahụ dịka otu n’ihe e ji mee ọgbakọ (conference)  CBCN nke mbụ n’afọ.

  Ha malitere njem ahụ site na National Ecumenical Centre Abuja wee ruo na Our Lady Queen of Nigeria Catholic Church, Area 3, Garki Abuja.

  Onye nọrọ n’isi na njem ekpere ahụ bụ onyeisi CBCN Bishop Augustine Akubueze, ebe ndị bishọp Nigeria nọcha ya, nke gụnyere onye bụbụ Archbishop Abuja Archdiocese, Cardinal John Onaiyekan.

  Onyeisi CBCN, Bishop Akubueze gwara ndị nta akụkọ okwu mgbe e mechara ngagharị ahụ kọwara sị; “Anyị bagidere njem udo a n’aha ihe karịrị nde iri ise ndị Katọlik na ndị otu Kristi karịrị otu narị nde (100million) n’ala Nigeria maka ogbugbu a na-egbu ndị Nigeria aka ha dị ọcha site n’aka ndị Boko Haram na ndị na-achị ehi (herdsmen), bụ ndị na-awakpo ugbo ndị mmadụ n’ike.

Anyị na-eme mkpesa anyị megide ntọrị mmadụ maka ego, nke a na-eme na Nigeria niile, anyị na-erukwa ụjụ ụmụnwaanyị, ụmụaka e ku n’aka, ụmụaka na ụmụnwoke ndị ha gburu egbu na nso nso a.

GUO:  Korona: Ndị bishop ụka Katolik ewepụtala ụlọgwụ karịrị narị anọ maka ogige nleta maka ọrịa korona

Gọọmenti kwesịrị ịmata na ike agwụla anyị ịnụ site n’aka ha na e meriela Boko Haram ebe ha ka na-akpakwa ike na-aga.”

  Bishop Akubueze gara n’ihu kwue na ngaghrị ‘protest’ bụ otu n’ime ọrụ dịịrị ha n’ụka iji kwuputa megide ihe ọ bụla megidere iwu nke Chukwu, ma kọwakwaa na e nweela olili ozi ọtụtụ mmadụ n’otu oge (mass burial) ugboro ugboro, ntọrị ụmụakwụkwọ, ndị njem, mwakpo ụlọ ndị mmadụ, ebe nsọ dị iche iche dịka ụlọụka, ebe ọzụzụ ndị ụkọchukwu na nso nso a.

  Otu o sila dị, o kwere President Muhammadu Buhari nkwa na ụka ga-aga n’iru na-ekpe ekpere ma na-enye ọchịchị ya nkwado iji megide ọnọdụ enweghị ezi nchekwa ma ọ bụrụ na ọ ga-agba mbọ jikọta ndị Nigeria ma hụ na onye Nigeria ọ bụla nwetara oke ruru ya n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ okpukperechi ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here