NDỊ Nigeria Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) kọmandi steeti Gombe ekwuputala na ịńụ ọgwụ ike (drug abuse) n’ebe ụmụnwaanyị nọ na steeti ahụ esila n’ịńụ ọgwụ ndị ahụ ha na-ańubu wee banye n’ihe ọzọ. Ha kwuru na ụmụnwaanyị na-esizi ihe ha jị nọọ na nsọ (sanitary pads), zaa ya ma ńụkwaa mmiri ya ka ha wee dị ike ‘high’.
Oge ọ na-akọwara ndị bi na Bajoga, isi obodo okpuru ọchịchị Funakaye nke steeti ahụ, kọmanda nke na-ahụ maka Funakaye ‘Area Command’ Muhammed Alkali kwuru na ya bụ ajọ ihe na-agbasa n’ike n’ike na steeti ahụ.
O kwuru na òtù ahụ (agency) bagidere ọnọdụ nkọwa ahu n’obi eze Emir nke Funakaye iji wee me ka ndị ọchịchị obodo sonye n’ibuso agha medige ọgwụ ike.
O kwuru sị; “Anyị achọpụtala na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-ańụ ọgwụ ike ahụla ụzọ ọzọ ha si eme onwe ha ka ha dị ike ‘high’ n’agaghị ńụba ọgwụ ndị a ma ama. Ugbu a ha na-esizi ihe ha ji nọọ na nsọ, gwakọọ ya na ihe ọzọ, zaa mmiri ahụ tupu ha ańụọ ya. Ihụla na ihe a dị ezigbo njọ n’ebe anyị nọ dịka mmadụ.
Obodo anyị chọrọ enyemaka onye ọ bụla n’ibuso ajọ ihe a agha ebe NDLEA agaghị emeli ya sọọsọ ha.
N’okwu ya n’oge ahụ, Principal Staff Officer na-ahụ maka yunit (press and special duty), Akomolafe Adekola kwuru na ha nwụchikọrọ mmadụ dị iri isii na iteghete maka ịńụ ọgwụ ike n’afọ 2019; ma nọrọkwa n’oge ahụ dozie ọnọdụ mmadụ iri atọ na otu.
Dịka ọ nọ na-achọ ka ndị ọchịchị obodo na ndị isi ụka, tinyere ndị ọnụ ruru n’okwu ebe ahụ ịga n’ihu na-enye ha nkwado, Maazị Akomolafe kwere nkwa na kọmandị ahụ dị njikere ịchụpụ ndị omekome chọrọ ịgbanwe okpuru ọchịchị obodo ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-ere ma na-ańụ ọgwụ ike.
N’akụkụ nke ya, Emir nke Funakaye bụ Alhaji Abubakar Kwairanga kpọkuru ndị ntorobịa na ndị niile ọ na-achị ka ha jụ ọgwụ ike ma na-eme nke ọma.