MINISTA na-ahụ maka ndị ntorobịa na ịkwalite egwuregwu (Minister of Youth and Sports Development), Maazị Sunday Dare bịara na steeti Anambra maka asọmpi egwuregwu ndị uweojii (Nigerian Police Games)
agba nke iri na abụọ ya, nke a malitere na Satọdee gara aga ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri abụọ na iteghete ma bụrụ nke ga-akwụsị na Satọdee a, ọnwa Maachị ga-adị n’abalị asaa, afọ a bụ 2020.
N’ozi ya, minister ahụ bụ Dare kwuru na obi bụ ya ańụrị ịbịa na steeti Anambra maka egwuregwu ahụ. Ọ kọwara na asọmpị ahụ ga-eme ka a chọpụta ọnatarachi ndị mmadụ dịka o sị emebu n’ala anyị.
O kwuru sị; “Ọ dị ezi mma, ana m akpọku ngalaba ndị ọzọ ka ha gbasoo ya n’ihi na ọ na-akwalite ịdịnotu, omenala, ezi ihe (values) na nchekwa obodo. Anyị nwere olile anya na ọnatarachi (talent) ọhụrụ ga-apụta ihe site n’asọmpi egwuregwu ndị uweojii, nke ga-eme ka e nwee ndị ga-anọchị anya ndị ụmụnwoke na ụmụnwaanyị anyị dị mbụ eme egwuregwu bụzi ndị na-aka nka.”
Ka anyị cheta na egwuregwu ndị uweojii ala anyị azụpụtala mmadụ dịka Chioma Ajunwa, onye bụzị osote kọmishọna uweojii ugbu a.
Ndị ọzọ a chọpụtara site n’asompi ndị uweojii bụ Super Eagles (player) Julius Aghahowa, Sunday Ibada lara mmụọ, tinyekwara Samuel Peter onye nke e ji Nigeria nightmare wee mara.