OTU nnọọronwe (non-profit organisation) Onyebuchi Chris Ifediora (OCI) Foundation enyela ụmụakwụkwọ iri ise na abụọ ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ junịọ na sinịọ sekọndịrị na steeti Anambra onyinye iji nyere ha aka inweta ihe ha chọrọ n’agụmakwụkwọ.
Ndị nwetara ohere ọma ahụ bụ ụmụakwụkwọ a họpụtara site n’ụlọakwụkwọ gọọmenti dị n’okpuru ọchịchị Anambra East, Anambra West na Ayamelum; n’okpuru Ifedioramma Okafor Memorial Secondary School Academic (IFOMSSA) Awards.
Ka ọ na-enye onyinye ‘award’ ahụ na Tuzdee na Fr Joseph Memorial Secondary School, Aguleri nke dị n’okpuru ọchịchị Anambra East, onye hibere OCI Dọkịnta Chris Ifediora kwuru na ya bụ emume ome n’afọ bụ agba nke anọ ya.
Ifediora, onye nke onye ndụmọdụ otu ahụ banyere iwu (legal adviser) Maazị Steve Ononye nọchịtere kwuru na ụmụakwụkwọ dị otu narị na iri abụọ eritela uru site n’amụma agụmakwụkwọ n’efu ahụ kemgbe 2017.
O kwuru sị; “Ndị niile ritere uru a lere ule nke a kpọrọ IFOMSSA Challenge nke e mere ka ọnwa Janụwarị dị n’abalị iri abụọ na asaa, tupu a họpụta ha. Mmadụ iri atọ na asaa ritere uru a n’ogo junịọ bụcha ndị Nsugbe na-agụ akwụkwọ na Community High School, Nsugbe ebe mmadụ iri na ise ndị sinịọ bụ ndị si n’okpuru ọchịchị atọ (LGA) ahụ.
Ifediora kwuru na ebumnuche onyinye ‘award’ ahụ bụ maka ịkwado ụmụ na-eto eto si okirikiri Omambala nke steeti Anambra iji nweta ogo dị elu na mmụta.
Mmadụ iri na ise nwetara ya site na sịnịọ ritere puku naịra iri atọ n’otu n’otu, maka ụgwọ ule WAEC na NECO, ebe ụmụakwụkwọ dị iri atọ na asaa nọ n’ogo junịọ nwetara puku naịra ise n’otu n’otu maka ụgwọ ule junịọn WAEC.