ỌRỤ mmepe obodo pụtara nnọọ ihè, dịka ụmụnwaanyị obodo Abateete dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra màlitère ịkọchasị na ịkpochasị ọwà mmiri ruchiri eruchi na mpaghara ahịa dị iche iche n’obodo ahụ.
Mpaghara ebe ndị ahụ a kọchasịrị gụnyèrè ahịa Eke Abatete nakwa ahịa Eke Agụ Abatete, bụ ebe ụmụnwaanyị ahụ nọrọ wee kpochasịa ọwà mmiri abụọ dị n’akụkụ ụzọ awara-awara gara n’ihu ahịa abụọ ahụ.
N’okwu ya banyere nke ahụ, onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ steeti ahụ n’ihe gbasaara gburugburu, bụ Maazị Obiajụlụ Nwankwọ kọwara ya bụ ọrụ dịka nke magburu onwe ya, nakwa ezigbo nzọpụụkwụ n’ịkwàlite ọnọdụ adịmọcha.
Maazị Nwankwọ, onye bụ onye nlekọta atụmatụ “Dobe Anambra Ọcha” na mpaghara Anambra South gazịrị n’ihu tòó aka na-achị steeti ahụ, bụ Dobe Anambra Ọcha”, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nà Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu n’ime steeti ahụ,
bụ Maazị Obi Nwankwọ maka ezi ọrụ ha n’ịkwalite ezi ọnọdụ gburugburu ahụ, ọ kachasị site n’iguzobe atụmatụ “Dobe Anambra Ọcha”, nakwa ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ ha si eme nke ahụ.
Dịka ọ na-akọwa idebe gburugburu ọcha dịka ọrụ dịịrị onye ọbụla, ọ jakwazịrị ụmụnwaanyị ahụ ike, kpọkuo ha ka jide ka ha ji, ma kpọkukwazie ndị ọzọ nọgasị n’ime obodo na mpaghara ebe dị iche iche ka ha ñomie nke ahụ, ọ kachasị ugbua udummiri na-akpụdobe nso n’ike n’ike.
Na mbụ n’okwu nke ya, onye chịkọbara ụmụnwaanyị ahụ iji bagide na ya bụ ọrụ, ma bụrụkwa onye enyemaka ọzọ pụrụ iche nye Gọvanọ n’ihe metụtara gburugburu, bụ Oriakụ Amaka Agụkwe kwùrù na ya mèrè nke ahụ n’ịgbaso ntuziaka nwa amadi ahụ jiri aha otu ndọrọndọrọ APGA wee zọọ ọkwa ịnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North na South n’ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Ifeanyị Ibezi nyèrè bànyere nke ahụ.
Ọ kpọkukwazịrị ọhaneze ka onye ọbụla tụnye ụtụ nke ya n’ụzọ ọbụla o nwere ike iji hụ na gburugburu ya na-adị ọcha mgbe ọbụla, ma kwụsịkwa iji ahịhịa na atịtị were asụchisi ọwa mmiri n’ihi ajọ ọnọdụ gburugburu na ihe ndị ọzọ nke ahụ pụrụ iweta nye ndụ na ahụike ụmụ mmadụ.