AKA ndị uweojii steeti Oyo akparala ụmụikorobịa atọ bụ ndị dakporo nwunye pastọ ha, kwaa ya iko n’ike. Ya bụ ihe mere n’Akinyele dị na steeti Oyo.
Ụmụ nwoke atọ ahụ, Kehinde Olajide, 32, Ayoola Richard, 23, na Felix Babalola, 27, bụ ndị dakporo nwunye pastọ ha n’ụlọ pastọ ahụ, n’elu akwa ya (matrimonial bed) bụ ndị na-agara pastọ ahụ ozi n’ụzọ dị iche iche.
Otu n’ime ha bụ Richard sị dịka ha na-aga n’ụlọ pastọ ahụ enyere ha aka n’ozi ụlọ, na ha na-adị na-enwe agụụ ịkwa iko n’ebe nwaanyị ahụ nọ; ha na-echekwa ka ha ga-esi mejupụtakwa echiche ha.
Richard gwara ndị uweojii na ya nwetara ohere imejupụta echiche ọjọọ ha ka pastọ ahụ bụ Olajire Bayo kpọrọ ya n’ụbọchị ahụ ka ọ gaa n’ụlọ ya chịrị akwa ndị adịghị ọcha chịgara ọsụ akwa (dry cleaner). O kwuru sị; “Akpọrọ m ndị enyi m abụọ na-eso m aga ebe ahụ ka ha soro m gaa. Otu o sila dị, anyị adịla na mbụ kpebie ịkwasa ya iko (nwunye pastọ) ụbọchị ọ bụla anyị hụrụ sọọsọ ya n’ụlọ.
Ka anyị ruru ebe ahụ, anyị hụrụ ya dịka ọ sachara ahụ mara towelụ. Okweghịzi anyị odidi, ya mere anyị soro ya baa n’ime ọnụ ụlọ ha, kpuchie ya ọnụ, kpọchie ụzọ ma gwa ya na anyị ga-eti ya ihe ma o kwuo okwu dịka anyị kwasara ya iko n’otu n’otu.”
O kwuru sị na ha amaghị na ọ ga-enwe ike ikwuputa ma gwa ya onye ọ bụla, ma ọ bụ di ya n’ihi na ha dọrọ ya aka na ntị ka ọ hapụ ikwu ihe merenụ; ma na ya chọpụtara na ihe ha gwara ya enweghị isi oge ya hụrụ ndị uweojii n’ụlọ ya.
Ka ọ dị ugbu a, Richard na ndị otu ya nọzị na mkpọrọ ndị uweojii (Oyo State Police headquarters), ebe a kpọgara nwaanyị ha dakporo n’ụlọọgwụ Akinyele Community General Hospital maka nnyocha na ọgwụgwọ.
Onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti ahụ (PPRO) Maazị Bello Olayemi kwuru na a ga-akpụpụ ụmụnwoke ahụ ụlọikpe maka ndakpo na mmeru (rape and assault).
Ọ gara n’ihu kwuo na ya bụ ihe ga-abụ ihe nkuzi n’ebe ndị mmadụ nọ; na ọ bụghị onye ọ bụla ka mmadụ na-anabata na be ya ka o soro na-aga ozi ụlọ. Ọ kọwara na ụlọ mmadụ dị nsọ na ọ bụghị ofiisi, ụlọụka ma ọ bụ ọdụ ahịa ebe mmadụ ga-eji na ọ bụ pastọ na-ezi ndị ntorobịa nọ nkịtị ozi dị iche iche.