GỌỌMENTI steeti Anambra eguzobela usoro agụmakwụkwọ pụrụ iche (Special Academic Calendar) maka obodo ndị bi na mmiri (riverine) na ebe iju mmiri na-adọ na steeti ahụ.
Anambra State Executive Council, dịka ha kwadoro usoro ọhụrụ ahụ site n’arịrịọ kọmịshọna na-ahụ maka mmụta na steeti ahụ bụ Ọkammụta Kate Omenugha n’ihi na ụmụaka si n’ebe ndị ahụ mmiri na-akpa mkpamkpa anaghị abịacha akwụkwọ otu o kwesịrị dịka ọnọdụ ahụ siri dị, nke na- ewecha tem mbụ ‘first term’ nke izuụka iri na atọ.
Dịka ozi nke e binyere aka na ya n’aha kọmishọna ahụ site n’aka odeakwụkwọ ọkpọtọrọkpụ (Permanent Secretary), ministrị ahụ bụ Maazị Linus Nwankwo, o kwuru na kansụl ahụ nyere nkwado na tem mbụ (first term) nke 2020/2021 ga-ebido na August 3, wee ruo Septemba 4, 2020 dịka agụmakwụkwọ mechiri na Julai 24, 2020 ma nwechaa obere ezumike n’August 2, 2020.
Ọ kọwara na ezumike ga-ewere ọnọdụ site na Septemba 7 ruo na Oktoba 30, 2020, ebe klaasị ga-amalitekwa ọzọ na Novemba 2 ma mechie na Disemba 18, 2020, dịka ha na ndị ọzọ ga-ebido ezumike Ekeresimesi na Disemba 18, 2020 ruo Jenụwarị 4, 2021 ma malite tem nke abụọ (second term) na Jenụwarị 4, 2021.
Ọ kpọkuru ndị isioche Anambra State Post Primary Schools Service Commission, the Universal Basic Education Board, Zonal Directors, Zonal and Area Education Officers, Education Secretaries, tinyere ndị niile ọnụ ruru n’okwu na zoonu na okpuru ọchịchị ndị ahụ ka ha buru ọnọdụ ahụ n’uche maka nleru anya na itinye uchu n’ọrụ.