N’IHI ọrịa ọjọọ coronavirus, mahadum Nnamdi Azikiwe University, Awka (UNIZIK) akwụsigodula ihe ọmụmụ asụsụ China (Chinese Language) a na-eme na Confucius Institute. Ha mere nke a n’ihi na ndị Igbo kwuru okwu wee sị na nkwụcha abụghị ụjọ.
Ya bụ ngalaba (institute) nke na-ahazị ihe ọmụmụ ahụ site na njikọ aka nke mahadum ahụ na-emekwazi ihe ọmụmụ (exchange programme); ha na ụfọdụ mahadum dị na China.
Onye kwupụtara mmechi e mechiri ụlọakwụkwọ ahụ bụ onyeisi (Vice Chancellor) UNIZIK bụ Ọkammụta Charles Esimone n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ dịka ọ na-ekpughe atụmatụ banyere emume nturu ugo (convocation) agba nke iri na anọ nke mahadum ahụ.
Ọkammụta Esimone kwuru sị; “Ihe gbasara ọrịa coronavirus metụtara ụfọdụ ihe ọmụmụ anyị, ọ kachasị Confucius Institute. Disemba gara aga ọtụtụ ndị nkuzi asụsụ Chinese na ngalaba ahụ lara ezumike, mana oge ọrịa a malitere na mbido afọ a, anyị kwụsịgoduru ya bụ ihe ọmụmụ ma kwụsị ha ịlọchịghata azụ ozugbo.”
Ọ kọwara na n’ihi otu mahadum ahụ sị kpọ ihe ọmụmụ ahụ mkpa, na ha na-atule ịmalite ya site n’usoro ‘online’.
Ọ gara n’ihu kwuo sị; “Anyị anwaala oke anyị na mmụta. Anyị atụnyela ọtụtụ ụtụ maka ezi mmụta. Anyị na-enyocha ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ n’ule site n’iji ihe onyoonyoo CCTV iji hụ na ndịnkuzi na-arụ ọrụ ha, ya na iji gbochie ụmụakwụkwọ igwu ojoro n’ule.”
Dịka o si kwu, mbọ ahụ akwalitela ezi mmụta na mahadum ahụ.