OTU Christian Association of Nigeria (CAN) akpọkuola goomenti n’ogo ọbụla ka ha nyere ndị nke ha aka site n’inye ha ihe dịka o kwesiri (palliatives) iji belata nsogbu sitere na mmechi ihe niile (nationwide lockdown) nke a no na ya maka igbochi coronavirus na Nigeria.
N’otu aka ahụkwa, CAN kpọkwara oku ka ụka Christ dị iche iche n’ala anyị mekwaa otu ahụ n’ebe ndị nke ha nọ ka ha wee belata ahụhụ nke ọnọdụ ahụ wetere.
Onyeisioche CAN, Rev Samson Ayokunle, onye kwuputara nke a ka ọ na-ekwu okwuchukwu (online) kwuru na e kwesịrị ka a mụta ihe site n’aka ndị mba ọzọ site n’ihụ na e nyere ndị mmadụ ihe ndị ha ji adi ndụ, ọ kachasị ndị ụwa na-atu n’ọnụ.
ọ gara n’ihu gwa ụmụ Nigeria ka ha kwụsi ịtu egwu ma nwee okwukwe na Chineke iji gbanari ọrịa Coronavirus. O kwuru na o kwesiri ka ndị mmadu nwee ntụkwasa obi n’ebe Chineke nọ mgbe ọ bula ha nwere ihe iche aka mgba na ndụ ha.
O kwuru sị; “Ana m akpọku goomenti ka ha nyere ndị agaghi egboli mkpa dịịrị ha n’ubọchị aka n’ihi mmechi e mechiri ebe niile (lockdown order). A gaghị akpọchi mmadụ n’agụụ ogologo oge. ọ bụghị sọ ụnụ bụ goomenti nyere ụdị iwu ahụ, goomenti na mba ụwa niile na-agbatara ndị nke ha ọsọ enyemaka.”
Onye ozi chukwu a kọwara na mba USA eweputala akatamkpo ego iji nyere ndị nke ha aka; ma kwukwaa na ha jikwa oge a dozie nkewa ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’etiti ha ma jikọta aka ọnụ wee na-arụ ọrụ ọma.
Ya mere, ọ kpọkuru goomenti ala Nigeria ka ha mekwaa otu ahụ, n’ihi na ọ ga-eme ka e nwee ntụkwasa obi n’ebe ha nọ.