NDI otụ ọ dị n’aka ihụ na ndị mmadụ debere Iwu e tiri ka onye ọ bula nọdụ n’ụlọ ya (Stay-at- home) anwụchikọọla Pastọ maka ida iwu.
Nke a dapụtara ụbọchi uka na Federal Capital Territory(FCT) dika na a nwuchikoro onyeisi (General Overseer) nke Jesus Reign Family Church bụ U Uden.
ụlọuka ahụ di n’ Apo ka e kwuru na o juputara na mmadụ mgbe ndị ọtu ọru ahu biara. dịka a nọ n’ofufe nru(worship). Ha cheere pastọ ahụ ka ọ gbasachaa ụka tupu ha gakwuru ya, kọwaara ya iwu ọ dara ma nwụchikọọ ya ozugbọ.
Ha kpụụrụ ya gaa n’ogige ndị uweojii nke FCT Police Command nke dị na Garki , hafee ya n’ aka ndI uweojiI nọ ọrụ.
Ndi ọtụ ahụ chụsakwara ndị ụka n’ụlọụka Christ Embassy Church, Jahi District, FCT. N’agbanyeghi nke ahụ, otu pastọ nke akpọghị aha ya gara n’ihu kara ụka na-aga ebe ndi ahu cheere ya ịjị gbanarị nsogbu. Ya mere,ka ọ kachara ụka ha nwụchikọrọ ya, kpụga ya n’ogige ndii uweojii Gariki.
Ndi ọtu ahụ mechikwara ụlọuka ịri na anọ ndI ọzọ dara iwu na FCT.
Ndi Federal Capital Territory Administration ahụ gara n’ ihu mechie ebe a na-ere ọgwụ a maara nke ọma bụ H-Medix Pharmacy dị na Wuse H District site na mkpesa nke e nwetara na FCT Covid-19 Station Room nke kwuru na ụlọọrụ ahụ enweghị ihe nchekwa ahụke a kpọrọ ‘short- gun thermometer’, na ngwa ọrụ ndị ọzọ maka ezị nchekwa ndị ọrụ na ndị ahịa ha.
Ndi ọtu ọrụ ahụ emeela na “enwetakwuru ọtụtụ akwa (bed) na Gwagwalada Specialist Hospital na Karu General Hospital iji zọta ndụ onye ọ bula e lere anya na o bụ nje Covid -19 .
Dọkịnta Ramatu Tijiani Aliyu bụ FCT ”Minister of State” kwuru na nke ahụ abụghị ịjị tinye egwu n’obi ndị bi okirikri ahu kama ọ bu iji kee nkwụcha.
ọ kpọkukwara ha ka ha mee ihe niile a gwara ha mee maka ọdi mma ha iji gbanarị ajọ ọrịa ahụ.