NDỊ ụlọ nnọchianya etiti ala anyị, bụ ndị nọ n’ụlọ omebe iwu ‘Federal House of Representatives’ ekwupụtala mkpebi ha inye ụgwọ ọnwa abụọ ha n’ịkwàdo agha ahụ gọọmenti na-ebu megide ọrịa ‘Corona Virus’.
Nke a bụ nke e kwupụtàrà site n’ọnụ okwupụta okwu ụlọ omebe iwu ahụ, bụ Maazị Femi Gbajabiamila site n’ozi ọ kụpụrụ nso nso a, bụkwa nke o kwuru na ha ga-eji ụgwọ ọnwa Maachị ha wee màlite. O mere ka a mara na a ga-eziga ego ahụ site n’akàrà akpaego ‘National Relief Fund’ e wepụtàrà maka ibu agha megide ya bụ ọrịa.
Ọ kọwàrà na ntụnye ahụ dịkwà ichè na nke ụfọdụ ndị omebe iwu ahụ (dị narị atọ na iri isii n’ọnụ ọgụgụ) mègòrò n’ótù n’ótù n’aka nke onwe ha, bụkwa nke ọtụtụ n’ime ha mèrè n’ụzọ dị iche iche, ọkachasị iji bèlata ihe ndị ha na-anọchite anya ha na-agabiga n’ime oge a.
Maazị Gbajabiamila gakwàrà n’ihu kọwàpụta na ụlọ omebe iwu ahụ agwala ụlọ ọba ego etiti, bụ ‘Central Bank of Nigeria’ (CBN) ka o nye okpuru ọchịchị narị asa na iri asaa na anọ e nwere n’ala Nigeria ego nkwàdo iji bèlata ntaramahụhụ ụmụ mmadụ n’ime okpuru ọchịchị ime obodo niile ahụ, ọkachasị ugbua a sịzị onye ọbụla nọrọ n’ụlọ, ka e wee gbanahị maọbụ bèlata mgbasàwanye nke ya bụ ọrịa.