NDỊ uweojii Steeti Ogun anwụchikọọla otu mmọnwụ maka ịda iwu goomenti steeti ahụ tiri gbasara ọgbakọ otụtụ ndị mmadụ n’otu ebe nke so n’otu ụzọ e si egbochi nkesa ọrịa ọjọọ Coronavirus.
A nwụchikọrọ mmọnwụ ahụ oge ọ gakwuru ndị uweojii wee gwa ha na ọ ga-emesi ha ike ma ha chụsaa ndị na-eso ya n’azụ (ụmụ nkwụ ya). Onye okwuputa okwu ndị uweojii na Steeti ahụ, Abimbola Oyeyemi n’okwu ọ gwara ndi nta akụkọ kwuru na ọ bụ ụbọchi ụka ka a nwụchikọrọ mmọnwụ ahu n’Ijeja dị n’Abeokuta site na mkpesa nke ndị mmadụ na igwe mmadu dị narị kwuru narị gbakọrọ n’ebe ahụ.
Oyeyemi kwuru na emume ahụ bụ maka ime emume mmọnwụ (masquerade festival) n’ebe ahụ. O kwuru na emume ahụ tinyere egwu ikesa ọrịa coronavirus n’obi ndi okirikiri ahụ.
O kwuru si, “Dika e nwetara mkpesa, ndị uweojii nke Ibara Divisiọn gara ebe ahụ dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbasasịa; mana, mmọnwụ ahụ wakporo ndị uweojii, ma kwuo na ya ga-emesi ha ike ma ha gaa n’ihu ichụsasị ndị na-eso ya. A nwụchikọrọ mmọnwụ ahu ozugbo ma kpọga ya n’ogige ndị uweojii ebe a dọrọ ya aka na ntị ka ọ na-asọpụrụ iwu, tupu a tohapụ ya.”