NWATA nwoke gbara afọ iri na asaa awakpola ma kwasa nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise iko n’ike. Nwata ahụ aha ya bụ Junior David ji mma bata n’ụlọ nwaanyi ahụ aha ya bụ Oriakụ Helina Aborsi n’elekere iri nke ụtụtụ wee yie ya egwu, dakpoo ya n’ike ma werekwa ego ya. Ya bụ arụ dapụtara n’Onogbolo di n’Ubiaja n’okpuru ọchịchi Esari South-East, Steeti Edo.
David, onye nọ n’ụlọakwụkwọ ogo SS1 tupu ọ pụta (dropout) nke Udagba Secondary School kwuru sị: “Abatara m n’ụlọ ya n’ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ ka ọ na-arahụ ụra. Oge o tetere wee hụ m, eji m mma wee yie ya egwu. Eyipuru m ya ọbante ya n’ike, yinye okpu nna bụ enyi (condom), wee kwasa ya ịko. Ewerekwara m puku naịra iri ya”.
Tupu ndị isi obodo ahụ akpọọ ya, o werela ego ahụ mee ihe dị ya mma. O kwuru sị: “Eji m ego ahụ goro akpa akwụkwọ, akwa akwụkwọ, akwụkwọ e ji ede ihe dị asaa, ihe mgbakọ (calculator) na mkpịsị odee”. David kwetekwara na ya akwasala iko ma zukwaa ọtụtụ ndị mmadụ ohi n’obodo ahụ.
Nwaanyi ahụ ọ kwasara iko n’ike bụ Aborsi, gwara ndị nta akụkọ sị, “ọ bụ n’ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ, ọ ga-abụ na ọ batara ma zoo n’azụ ụzọ mgbe m na-aza azụ ụlọ. Ozugbo m bata n’ọnụ ụlọ m, ọ bagidere m ma were ike yipu akwa m yi n’ime na akwa m.
Oge m tiri mkpu, o jiri pilo kpuchie m imi. Oge m tiri Jesus, Jesus ọ jụru m: onye bụ Jesus? Ya mere, o wepụtara mma. O buru ụzọ were puku naịra iri m. O kwuru na ọ bụrụ na m jụ na ọ ga-egbu m. Ahapụrụ m ya o mee ihe bụ uche ya. Ka o mechara, ọ gwara m na ọ bụrụ na m gwa mmadụ ihe merenụ na ọ ga-egbu m.”
Ndị uweojii mechara kpọgara nwaanyi ahụ ụlọọgwụ General Hospital Ubiaja.
Otu onye ndu obodo ahụ, Joseph Osagie gwara ndi nta akụkọ na ya bụ nwata nwoke enweghi isi na mmadụ (a never-do-well), onye nke ha nwetegoro ọtụtụ mkpesa gbasara arụ dị iche iche ọ kpara n’oge gara aga.