Ngwa nri (ingredients)
Anụ: anụ ewu, anụ efi -jiri nnu na mmiri saa ha nke ọma.
Azụ ọkpọọ, Okporoko, Ayịya, ọgbọnọ, ụgụ,
ụzụza (ma ọ bụrụ na ị chọrọ)
Mmanụ nri (palm oil), Ose, Yabaasị, Ogiri okpei,
Nnu, Magị
Usoro (method)
Sinye ite n’ọkụ, tinye mmiri, na anụ ndị siri ike dịka kanda, afọ anụ, shakị w.d.g.
Tinyere nnu, mmanu, yabaasị e bere kịrịkịrị, ogiri okpei na magi. Kpuchie ite ma hapụ ya ka ọ sụọ ụsụ ihe dịka nkeji iri abụọ.
Tinyezie anụ ndị ọzọ, azụ ọkpọọ, na okporoko. Hapụ ya ka ọ sụọ ihe dịka nkeji iri.
Tinyekwuo obere mmiri ma hapụ ya ka ọ sụkwuo nkeji iri ọzọ.
Mee ka ọ jụlata oyi ihe dịka nkeji iri. kpagharịa ya nke ọma ka ọ hapụ ire ọkụ.
Lete ma nnu ọ tụkwara ya, itinyezi ụgụ (na ụzụza)
Mee ka ọ sitụ n’ọkụ ihe dịka nkeji atọ tupu ịfọtụọ ya n’ala.
I nwere ike iji akpụ, garị ma ọ bụ nri osise wee rie ya.
N’ezie, ofe ogbọnọ bụ ọtọ n’ụbụrụ isi.