ỊKWỌ AKA
Ịkwọ aka bụ omenana Igbo di-adi. Mgbe gboo nwoke teta ụra ụtụtụ, o kuru mmírí kwọọ aka ya. Nke a bụ usoro mmadụ ji e dobe onwe ya ọcha ma dịkwa oche niru mmụọ.
Ọzọ, onye Igbo ga akwọ aka ya tupuu ọ waa ọjị ndị mmadụ ga ata. Ịkwọ aka e ji awa ọjị bụ omenana Igbo nke a na eme n’ihu ndị nine ga ata ọjị ahụ.
Ịkwọ aka tupu e tinye nri n’ọnụ bụkwa usoro ndị gboo si e bi ndụ.
Ọ bụrụ na ndi Igbo niile ga anabata omenana a ma na e me ya mgbe nine, ọkachaasị ugbua mba ụwa na e bu agha megide Nje-mmụọ-Korona (Corona Virus), i ga ahụ na anyị ga e meri ọrịa.
Omenana Igbo kwadoro ikwọaka mgbe nine, site na ya ka anyị ji egbochi ọrịa dicheche.
N’ezi okwu, atụmatụ a Ndị ọchịchị wepụtara banyere ịkwọ-aka mgbe nine bụ ihe omenala Igbo kwadoro.
Biko nụ ka anyị na a kwọ aka mgbe dum, ka anyị chụpụ Ọrịa na obodo anyị.
Nje Korona (Corona Virus) dị na ikuku…