IGBO sị na uche anaghị aka uche, kama ọ bụ chi na-aka ibè ya; ma sịkwa na ọ na-abụ e lelịa nwaite ọ gbọnyụọ ọkụ.
Ka ọ dị taa, otu nwaanyị sítéré Enugwu-Agịdị dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka na steeti Anambra emeela ka a mara na ya achọpụtala ma rụpụta ọgwụ pụrụ ịgwọ ma gbulaa ọrịa nje ‘Coronavirus’ kpam kpam.
Ya bụ nwaanyị, bụ Oriakụ Sun Okoye kwupụtàrà nke a n’isi ụlọọrụ ndị uwe ojii na steeti Anambra, dị n’Amawbịa, oge ọ gara ịkpọtụrụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii n’ime steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed, iji kọwaara ya maka ya bụ ọgwụ ọ rụpụtàrà, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ mee ka ụwà mara bànyere nke ahụ.
Dịka ya bụ nwaanyị sìrì kọwaa, ya bụ ọgwụ Igbo bụ nke ọ rụpụtara site n’ọhụhụ ụzọ nà mkpùghe ihe nke ime mmụọ, n’ihi na ya bụ onye ozi Chineke, tinyekwuoro na ya mèkwàrà nnyòcha dị omìmì tupuu rụpụta ya bụ ọgwụ, iji hụ na o nyèrè ihe a chọrọ. O kwùrù na ebumnobi o jiri rụpụta ọgwụ ahụ bụ iji tụnye ụtụ nke ya n’ụdị nke ya n’agha ahụ a na-ebu megide ya bụ ọrịa COVID-19, bụ nke na-eme mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche iche na mba ụwa ugbua.
Ọ kọwàrà na ọ bụ n’elu ahụ ka a na-ete ọgwụ ahụ, ma kọwaa na n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole e tèrè ya, na ihe niile ahụ bụ ihe e jiri mara ọrịa (bụ ‘symptoms’ n’asụsụ bekee) ga-eri mbọmbọ ọsọ, ebe ọrịa ahụ na njé ahụ na-ebute ya bụkwa nke a gaghị ahụtazịkwa ọzọ n’ahụ onye ahụ, n’ihi na ọgwụ ahụ gà-egbula ha kpamkpam.
Dịka ọ na-ekwupụta na ọ bụ ya onwe ya jiri aka ya wee rụọ ya bụ ọgwụ n’ime steeti Anambra, Oriakụ Okoye gàrà n’ihu kwuo na ọgwụ ahụ anaghị enwe mpụtàrà ọjọọ ọbụla n’ahụ mmadụ, bụ nke nwa bekee kpọrọ ‘side effects’ n’ihi etu o siri rụọ ya.
Ọ chètààrà ọhaneze na ọ bụ mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ, bụ ọgwụ Igbo ka e ji egbula ma na-agwọ ọrịa dị iche iche mgbe gboo, ma sịkwa na ihe ndị ahụ ka dịkwa irè ma na-arụkwa ọrụ nke ọma ruo ugbua, na-agbanyeghị na ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakụtazị ya azụ ma na-atụkwàsazị uche n’ọgwụ bekee.
Ọ kpọkùzịrị gọọmenti steeti Anambra, ndị ọnụ na-eru n’okwu, na òtù mba ụwa dị iche iche ka ha bịa nwàlee ma were anya ha hụ ihe ya bụ ọgwụ pụrụ ime n’ebe ọrịa ọjọọ ahụ nọ, maka na ọ na-adị mma a nụ íkpò ofe, e detụ ya ire, iji mara ma ọ na-atọkwa n’ọnụ ka o sì ekpò n’imi.
O kwupụtakwara njikere ọ dị inyefè ya bụ ọgwụ ahụ n’aka gọọmenti maọbụ ụlọọrụ ọbụla nke ahụ dị n’aka, ka ha nyòchaa ma nwalee ya.