DỊKA ụjọ ji ụwa niile banyere ọrịa ọjọọ coronavirus. Onye ukwu na onye nta n-agbasi mbọ ike ịhụ na o buteghị ya bụ ọrịa, makana Igbo kwuru sị na nkwụcha abụghị ụjọ.
Ihe dị iche iche e ji egbochi ọrịa ojọọ a gụnyere: ihe e ji ekpuchi imi, nke e ji akwọ aka w.d.g. ihe ndị ahụ niile galaziri ọnụ nke ukwu ugbu a n’ihi na onye ukwu na onye nta na-achọsi ya ike.
N’ihi ya, otụtụ ndị mmadụ n’ala anyị banyeziri ọrụ imepụta ihe ndị ahụ. ebe ufọdu na-akwa ihe mgbochi imi, ụfọdụ na-arụpụta ihe e ji akwọ aka. Ihe ndi a niile dị mma, mana ajujụ bụ ole n’ime ha zuru oke.
A bịa n’ihe e ji ekpuch imi, onye ga-akọwa ụdị akwa e kwesịrị iji kwaa ya ka mmadu nwee ike na-ekute ume nke ọma.
Banyere nke e ji akwọ aka, na egbu nje, mmadụ ole n’ime ndị ahụ na-arụ ya maara ihe banyere ọtu e si eme ya ka o wee nye ihe a chọrọ.
Otu nwaanyi na-emepụta ya, bidoro ya n’izuụka gara aga ka a jụrụ ma ọ na-emepụtabu ya mbụ, ọ sị mba. Ma mgbe a jụziri ya ihe ojikpebie imepụta ya ugbua, ọ zara sị nay a mabu usoro e si eme ya ma ihe ya ejighị emebu ya bụ na ọ naghị aga ahịa. ya mere dịka ọ maliteziri ịga ahia, ya onwe ya malitere mepụtaba ya n’ike n’ike.
Nwaanyị ahụ kwuru nay a ereela katọn kwuru katọn kemgbe ọra coronavirus jiri malite.
N’akụkụ nke ya, otu onye ji ihe e ji ekpuchi imi nke ndị na-akwa akwa kwara kpuchi imi kọwara na ihe ya ji goro nke ahụ bụ maka na ọ na-abụ ya laruo ụlọ ya na mgbede ya asụọ ya mmiri n’ihi nay a ejighi ego igota nke a na-agbanwekwa ụbọchị.
Dika ihe ndị ahụ niile e ji egbochi ọrịa coronavirus nọchazi n’ọnụ ahia dị elu, ndị mmadu ha na-aracha pịom.
ọzọ dika ibe ya bụ na ahịa ihe nri na-azụ gwoo gwoo, mana ha galaziri ọnụ karịa. ihe niile tinyere, osikapa, ji, gari w.d.g. dị ọnụ. Olee ihe jikọtara coronavirus na ige nri?
Ihe ndịa niile dị njọ, ọ bụ ụzọ dị iche iche mmadụ si emegide ibe ya.