COVID-19: Ndị Uweojii enwudela onye otu ha dara iwu onyeapụla ezi

0
254

NDI Uweojii kọmandị Lagos anwụchikọọla onye otu ha (onye uweojii ibe ha) na mmadụ abụọ ndị ọzọ o bu n’ụgbọala maka ị da iwu ịnọ n’ụlọ (stay-at-home) nke onyeisi ala Nigeria President Muhammadu Buhari tiri iji gbochi nkesa ọrịa ọjọọ coronavirus.

A kọwara na Inspektọ ahụ, onye nke anọghị ọrụ (duty) mgbe ihe ahụ mere na-aga ihe dịịrị ya.

kọmandi ahụ nyere ọmụma atụ a oge ha na-agọ agụgọ banyere ebubo nke ọtụ ọrụ ahuike Nigerian Medical Association (NMA) ngalabọ Lagos na-ebo ha sin a ha na-enye ndị otu ha ọrụ ahụike nsogbu gbasara iwu ịnọ n’ụlọ.

N’okwu ya banyere ebubo ahụ onye okwuputa okwu ndị uweojii bụ Bala Elkanah kọwara na ọ bụ ndị na ọnọghị n’ọrụ, na-agara mkpa ha ma ọ bụ ndị jị ọrụ anara ikike (impersonators) ka ha na-ejide.

E kwukwara na ndị uweojii Lagos nwụchịkorọ otu onye dibia oyibo na-arụ ọrụ na steeti ọzọ dịka ọ na-aga mkpa dịịrị ya; ọnọghị n’ọrụ.

GUO:  Ndị uweojii Anambra ejidela ndị otu nzuzo ebe ha na-anabata ndị ọhụrụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here