ACHỌỌPỤ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ Achbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim akpọkùóla ndị otu Christ ka onye ọbụla gbuo ikpèrè n’ala, kpekuo ma kpọkuo ihu Chineke bànyere ajọ ọnọdụ ọrịa nje coronavirus.
Achbishọọpụ kpọrọ oku a n’okwuchukwu ya ụbọchị ụka n’ofùfè nro pụrụ iche a chịkọbàrà iji merùbe ụka ọmụ nke ahọ 2020, bụ nke weere ọnọdụ n’ ụlọụka ‘Our Saviour’s Anglican Church’ dị n’Awka, ma bụrụkwa nke e mèrè n’ikùkù, nke ndị mmadụ sònyèrè na ya site n’usoro mgbasa ozi dị iche iche, nke gụnyere ụlọọrụ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service’ ụlọ mgbasa ozi Ogene FM, usoro nzikọrịta ozi Facebook, tinyere usoro ndị ọzọ dị iche iche.
Ọ kwàrà arịrị bànyere mkpamkpa dị iche iche ya bụ ọrịa kpàgòrò n’ụwa niile ugbua nakwa etu o siri metụta ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ, ụka na òfùfè nrò, nakwa ọnọdụ akụnụba mba dị iche iche, n’ụdị a hụtàbèghị mbụ, kemgbe okike ụwa.
Ọ kpọkùzịkwara ndị otu Christ ka ha kpekuo Chukwu Okike Abịama ka O meere ụwa ebere, gbaghara mmehie ụmụ mmadụ, ma wezùga ya bụ ajọ ọrịa ‘ọgbara ụwa ngharị’, n’ihi na ya onwe ya bụ Chukwu obi ebere, tinyekwuoro na O kwèrè na nkwa n’ime akwụkwọ nsọ, sị na Ya ga-agwọ ndị Ya nrịanrị ha ma nyeghachikwa ha ahụike ha n’ozuzu okè.
Ọ gwara ha ka tụkwasị obi na Chineke, na-etisi ‘Hosanna’ ike oge niile, bụ nke pụtara ‘Biko Zọpụta Anyị’, ọkachasị n’ogologo izuụka a dị nsọ, dịka a na-emerùbe ncheta njèm mmeri Christ gàrà na Jerusalem dịka eze, n’ihi na ya bụ ọrịa akarịghị okwu ọnụ Chineke maọbụ ihe dị iche iche O mèrè n’oge gara aga nakwa nke ọ ka na-eme.
O kpèkwazịrị ka Chineke meere ụmụ ya ebere ma zọpụta ụwa n’ihe otiti nke ajọ ọrịa ahụ, n’ihi na ọ bụ naanị Ya pụrụ ime nke ahụ, ọbụnadị dịka ọ rịọrọ ya ka o wezùga égwù, agụụ, ọnwụ mberede nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ na-adakwasị ụmụ mmadụ site n’ajọ ọrịa ahụ.
Ofufe nro ụka ọmụ ahụ bụ nke e mere n’usoro ịgbasò ntụziaka ahụ gọọmenti steeti Anambra wepụtara, ma bụrụkwa nke ọ bụ mkpụrụ mmadụ ole na ole sònyere na ya, nke gụnyere nwunye Achbishọọpụ, bụ Oriakụ Martha Chiọma Ibezim, nakwa ụfọdụ ndị ezinụlọ ha.
Ndị dị iche iche nyere aka n’ịkà ya bụ ụka ọmụ ụbọchị ahụ gụnyèrè ‘Venerable’ Clement Mgbemena, bụ onye debere òfùfè nro ahụ; ‘Venerable’ Samuel Okonkwo, bụ onye gụrụ ihe ọgụgụ sitere n’àgbà ochie; ụkọchukwu Humphrey Bosah, onye gụrụ ihe ọgụgụ sitere n’àgbà ọhụụ; na ‘Venerable’ Rex Kanu, bụ onye duru n’ekpere maka arịrịọ dị iche iche.