NDỊ uwe ojii steeti Anambra nọrọ na nso nso a wee nwụchikọọ mmadụ abụọ na-akwasò obere ụmụaka iko na steeti ahụ.
Nke bụ nke e kwupụtàra site n’ọnụ Maazị Harụna Mọhammed, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii na steeti ahụ.
Dịka o siri kwuo, otu onye n’ime ndị arụrụala ahụ bụ Maazị Emeka Ogbukaifedi’ (gbara ahọ iri abụọ na asaa) nọrọ n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Maachị ahọ a wee jiri ọgbatumtum buru otu nwata gbara ahọ iri na isii (bụ onye Okpuno-Ụmụogali dị n’Ọba, n’okpuru ọchịchị obodo Idemili South nke steeti ahụ), wee gaba n’ochie ọdụ ụgbọelu dị n’Ọba, bụ ebe ọ gwàrà nwata ahụ na nna ya sị ya buru ya bịa.
Mana mgbe ha rùrù n’ebe ahụ, ọ kpọzùgàrà nwata nwaanyị ahụ n’otu akụkụ, wepụta mma wee yie ya egwù, ma nọrọkwa n’ebe ahụ kwasoo ya iko n’ike, dọkasịakwa ọpante ya, ma were ya gbafuo; o nweghịzịkwa onye hụrụ ya anya ọzọ.
Oti ọ dị, ndị uwe ojii nwètara ozi banyere nke ahụ, ma gaa ozigbo, buru ya bụ nwata gaa ụlọọgwụ ebe a nọrọ wee leruo ya anya; ma, ha bụ ndị uwe ojii nọzịrị n’abalị atọ nke ọnwa a, nwụchikọọ ya bụ mkpi na-agbara ọha ewu n’ebe nzuzo ya.
N’akụkụ nke ya, onye nke ọzọ, bụ onye na-anya Keke aha ya bụ Maazị Monday Okeke (gbara ahọ iri abụọ na asatọ), bụ onye sitere obodo Izzi dị na steeti Ebonyi, nọrọ n’abalị iri abụọ nke ọnwa Maachị ahọ a, wee tọrọ otu nwata nwaanyị sitere Abba, n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra.
Akụkọ kọrọ na nwoke ahụ zòrò nwata nwaanyị ahụ n’otu ebe, ma were ikenga ya mazụrịa ya abalị atọ zuru èzù tupu ọ tọhàpụ ya. Ka a hụrụ nwata ahụ, e buru ya gaa ụlọọgwụ ọhaneze dị n’Enugwu-Ukwu, bụkwa ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ya ahụ, ma gbaa akaebe na e riri ya bụ nwata ọkọmbọ n’eziokwu.
Ka ọ dị taa, aka ndị uwe ojii ejidekwala ya bụ mkpi mbụba, ma o jikwara ọnụ ya kwuo hoohaa na ọ bụ ya mere ihe ahụ n’ezie.
Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị John Abang mèzịkwara ka a mara na e nyefèéla okwu ahụ n’aka ngalaba ga-ahụ maka nke ahụ bụ ‘State Criminal Investigation Department, Awka’ iji mee nyocha banyere ya, ma sịkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyocha ahụ.