NDỊ otu Anti-Piracy society of Nigeria (APSON) ekesaarala ụmụ Anambra ụfọdụ ihe ndị ahụ e ji egbochi ọrịa coronavirus.
Ihe ndị ahụ ha kesara gunyere ihe e ji ekpuchi imi (nose masks) di puku iri, ihe e ji akwọ aka (sanitizer) dikwa puku iri tinyere ihe a na-agba n’aka (gloves) di puku ise iji gwa ndị Anambra mkpa ọ dị mmadụ ịdị ọcha maka ịgbanarị ọrịa ọjọọ coronavirus.
Ebe ndị ha gara kesaa ihe ndị ahụ gụnyere Eke Awka, Nkwọ Enugwu ukwu, Oye Agu Abagana, Afor Igwwe, Oye Olisa na Afọr Nkpọr. N’okwu ya na njem ahụ, onye isioche zuzugbe (Director General).
Otu ahụ bụ Frank Uduonu kwuru na ọ chọputara na o nwere ndị ahụ n’ihi oke ọnụ ahịa nke a na-ere ha. Ya mere, APSON ji kpebie igbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka wee hụ na e chekwara ndụ mmadụ n’ebe ajọ ọrịa ahụ nọ.
ọ rụtụrụ aka na dịka otu Anti-Piracy, abụghị nke gọọmenti na o kwenyere na inyere ụmụ mmadụ aka.
Onyeisi APSON, ji ohere ahụ kpọkuo ndị Nigeria jiri biri ka ha mee ihe ha kwesiri ime iji zọta ndụ ndị mmadụ.
O kwuru sị; Ha ekwesịghị iche oge ịzọ ọkwa ọchichị ruru ka ha wee bido ikesa osikapa. Ugbu a bụ oge o kwesịrị ime ihe; ugbu a bu oge ịga eji gosi ndị nke gi ịhunanya, ọchịchị. Ndiịsi ụka anyi kwesịkwara ikunite. Ana m agwa nụ na ozugbo ha malitere mebe ihe ha kwesiri ime ọnụ aha ihe ndị a ga-adatu al aka ụmụ ogbenye wee.
ọ gara n’ihu dụọ ndị mmadu ọdụ ka obi sie ha ike karịa ịdị na-atụ egwu n’ihi na egwu na-egbu karịa ọrịa. ọ gwakwara ha ka ha na-agba mbọ ịgbochi ya ma na-akuzikwara ndị ọzọ, iji gbanarị ikesa ọrịa ahụ.
Uduonu, onyeisi APSON ahụ kpọkukwara oha na eze ka ha gba mbọ mee ihe niile iwu kwuru iji gbanarị ọrịa coronavirus.