OKE ọñụ dàrà nnọọ na nso nso a n’ogige ụmụaka enweghị nne na nna a maara dịka ‘Blessed-Nise Community Children’s Home’ dị na Nise, n’okpuru ọchịchị ime obodo Awka South nke steeti Anambra, dịka òtù nnọọrọ onwe a kpọrọ ‘Ogazi Foundationa’ jiri ọtụtụ ihe dị iche iche wee wee ga leta ya bụ ògìgè.
Ihe ndị òtù ahụ bùrù wee gaa ebe ahụ gụnyèrè ihe erimeri, ihe dị iche iche e ji akwalite ọnọdụ obibi ndụ, nakwa ihe ndị ọzọ mmadụ pụrụ iji chekwaba onwe ya pụọ n’ibute ọrịa nje ‘coronavirus’.
N’okwu ya oge ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka ndị nlekọta ogige ahụ, onye guzobere, ma bụrụkwa onyeisi òtù ahụ, bụ Dọkịta Chidi Okoye, kọwara na ebumnobi nke ahụ bụ iji tụnye ụtụ nke ha n’ime ka ihu ọchị waa ndị nọ na ya bụ ogige n’oge mmemme Isita a, ọkachasị ugbua ọrịa nje ‘coronavirus’ na-emezị mkpamkpa ma na-emetụtakwa ọtụtụ ndị mmadụ n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche.
Nwa amadi ahụ, nke ọ bụ otu onye n’ime ndị isi nlekọta òtù ahụ, bụ Maazị Marcel Manafa gụpụtàrà ozi ya, gàrà n’ihu kelee ndị nlekọta ahụ maka etu ha si elekọta ogige ahụ na ụmụaka nọ n’ime ya anya nke ọma, ya etu ha si edebe ma na-agbasòkwa ntụziaka gọọmenti nyèrè bànyere ịgbanahị na igbochi nkesa ọrịa ‘coronavirus’.
O kwupùùrù aka na-achị steeti Anambra, bụ Willie Obianọ maka ọtụtụ mbọ dị iche iche ọ gbagoro iji hụ na ya bụ ọrịa abataghị maọbụ gbasaa na steeti ahụ; ma kọwazie na njem ahụ ha bịara bụ iji kpọnyere gọọmenti aka na mbọ ahụ ọ na-agba ibelata mmetụta nke ọnọdụ a a nọ n’ime ya ugbua n’ahụ ụmụ mmadụ.
Ka ọ na-anabata ihe ndị ahụ e bùtèrè, onyeisi nlekọta ogige ụmụaka ahụ, bụ Oriaka Vera Ugochukwu kèlere ndị otu ahụ maka icheta ndị nọ n’ihe ụkọ na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ọkachasị ugbua ọrịa nje ‘coronavirus’ na-ebi obodo dị iche iche aka ọjọọ ma na-akpụkwa ọnọdụ akụnụba mba ụwa aka n’ala ugbua.
O kwùrù na ụlọọrụ ahụ na-akpachapụ anya nke ukwuu ma nọrọkwa n’ezi ihu n’ịgbaso ntụziaka gọọmenti banyere ajọ ọrịa ahụ, bụ nke mere na ha anaghị ekwezị ka ndị bịara abịa na ụmụaka nọ n’ogige ahụ gwùkọọ egwu ọzọ, dịka ọ dị na mbụ.