N’agbanyeghị ka ọnọdụ siri debe imi na ọnụ ugbua n’ala Nigeria, ihu ọchị wàrà ndị ọgbọ nta nkwado Ihiala nke abụọ, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala na steeti Anambra, dịka onye na-anọchite anya ha n’ụlọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Dọkịta Pascal Agbọdike kesààrà ha ihe erimeri dị iche iche.
Mmemme ikesà ihe ahụ bụ nke weere ọnọdụ na ngwùrù be onye omeiwu ahụ dị na Mbọsị, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ndu obodo dị iche iche dị n’ọgbọ nta nkwado ahụ, ndị eze ọdịnala, ndị ndu mpaghara wọọdụ dị iche iche iche, tinyere ndị ọzọ e ji okwu ha agba izù na mpaghara ahụ.
Ihe e kesààrà ndị ahụ bụ nke gburu ego ruru nde kwùrú nde naịra, ma bụrụkwa nke gụnyèrè akpa osikapa, akpa garị, ji, igbe noduul, bọkeetị na-agba mmiri, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji akwalite obibi ndụ na adịmọcha.
N’okwu ya na mmemme ahụ, Dọkịta Agbọdike mere ka a mara na ebumnobi nke ahụ bụ iji belata mmetụta iwu onye apụtakwala ezi e tìrì n’ihi ọrịa korona n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọkachasị n’ebe o metụtara igbochiri ha agụụ, na ịkwalite ọnọdụ nchekwa ha iji gbanahị ajọ ọrịa ahụ na-efe efe.
Ọ dụrụ ndị ndu ụmụnwaanyị obodo dị iche iche, bụ ndị o siri n’aka ha wee kesaara ndị obodo dị iche iche ihe ndị ahụ, ka ha gbaa mbọ hụ na ozi ahụ e ziri anwụrụ ọkụ rùrù eluigwe aka, site n’ịhụ na ihe niile ahụ rùrù ndị e mebeere ya aka.
O tòkwazịrị aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka mbọ dị iche iche ọ gbagòrò iji gbochie mgbasawanye nke ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ, ya na ihe dị iche iche o kesàgòrò iji mee ka ọnọdụ dịrị ụmụafọ steeti ahụ mfe na mma n’ime oge a.
Na ntụnye nke ya, eze ọdịnala obodo Mbọsị, bụ Dọkịta Greg Nwokorah, kèlèrè nwa amadi ahụ maka obiọma ya na ezi nnọchianya ya, ma kpọkukwa ụmụafọ obodo ya na ndị Anambra n’izugbe ka ha na-erube isi nye ntụziaka ahụ gọọmenti nyèrè iji gbanahị maọbụ gbochie mgbasawanye nke ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ.
N’okwu ha n’otu n’otu, ụfọdụ n’ime ụmụnwaanyị ahụ, nke gụnyere onye ndu ụmụnwaanyị wọọdụ nke ise n’Ọkịja, bụ Oriakụ Felicia Ohanyiri kelere Dọkịta Agbọdike maka icheta ha na ime ka ihu ọchị waa ndị ụwa na-atụ n’ọnụ dịka o si emebụ na mbụ, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ya mmaji kwùrù mmaji.