
NNEKWU ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji eme ọgọ.
N’ịgbaso nke a, onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ewu ewu n’imepụta erimeri noduul (noodle), bụ ụlọọrụ Tummy—Tummy, Maazị Chika Emenike ejirila nnọọ igbe noduul ruru otu puku n’ọnụọgụgụ wee sị gọọmentị steeti Anambra ya jisie ike n’ọrụ na mbọ ahụ ọ na-agba imemila ọrịa nje korona.
Maazị Emenike, oge ọ na-enyefè igbe noduul ahụ n’aka gọọmenti, kwùrù na nke ahụ bụ ụzọ ụlọọrụ ahụ chọrọ isi nye aka ma kwadokwa gọọmenti n’usoro dị iche iche o si agba mbọ ibelata agụụ na mmetụ iwu onye apụtakwala ezi n’ahụ ụmụafọ steeti ahụ, bụ nke e tiri n’ihi ọrịa nje korona.
O kwuru na ọ bụ ihe kwesiri ekwesi ka gọọmenti na-eme, bụ ịgba mbọ hụ na ndị mmdụ nwèrè nri ha ga na-eri ogologo oge niile ahụ a sị ha nọrọ n’ụlọ n’ihi ọrịa ahụ, maka na onye dunyere nwata inwude nkekwụ kwesikwara inye ya mmiri ọ ga-eji kwọ aka.
O mekwazịrị ka a mara na o kwesighị ka a hapụrụ naanị gọọmentị ime nke ahụ, ma sị na ọ bụ ya mere ụlọọrụ ahụ jiri kpebie iji ya erimeri noduul wee kwàdo ya.
Onye nabatara ihe erimeri ahụ n’aha gọọmenti ma bụrụkwa ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu fọrọ ekele n’ụkpa wee bunye nwa amadi ahụ na ụlọọrụ ya maka ya bụ nkwàdo pụrụ iche ma dàkwa ụdà.
O kelere ya maka ịña ntị n’ọkpụkpọ oku gọọmenti steeti ahụ kpọrọ, ka ndị Anambra na ụlọọrụ dịgasị n’ime steeti ahụ bịa kwàdo ya n’imezupụta atụmatụ dị iche iche o ji n’aka na nke ọ na-abagide, dịka o siri gbasara imemìlà ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ.
O kwere nkwa na a ga-ekesa ya bụ igbe erimeri etu o siri kwesi, nyegara ụmụafọ steeti ahụ.
N’okwu dịkwa ka ibè ya, otu nwa amadi na-anọchitebụ anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Idemili North’ na ‘Idemili South’ n’ụlọ nnọchianaya etiti ala anyị, bụ Maazị Ifeanyị Ibezi nọkwara ụbọchị Wedezdee wee nye gọọmenti steeti Anambra otu nde naịra, n’iji jaa ya ike n’agha ọ na-ebuso ọrịa nje korona na steeti ahụ.
Maazị Ibezi nyefere ego ahụ n’aka gọọmenti steeti ụnyaahụ n’obi gọọmenti dị n’Awka, ma rịọ ka a ka ha weregodi ya etu ahụ wee kwàdo ihe a na-eme, iji hụ na ya bụ ọrịa agbasaghị n’ime steeti ahụ.
O kelekwara ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ maka ihe dị iche iche o mepụtagoro n’ibuso ọrịa ahụ agha, na n’ịkwalite ọnọdụ obibi ndụ na ahụike ụmụafọ steeti, ma dụọ ya ka o kee ajị n’ume.