ONYEISIALA Nigeria, bụ Maazị Mụhammadụ Buharị ejirila izuụka abụọ wee gbatịwanyekwuo ụbọchị onye apụtakwala ezi na steeti Lagos, steeti Ogun, na FCT, bụ isi obodo ala ahụ.
Onyeisiala, Buharị kwupụtara nke a site na mgbasaozi pụrụ iche o mere ụbọchị Mọnde, bụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kọwaa ka eke si anya anwụ ugbua, dịka o siri metụta ọrịa nje korona n’ala Nigeria.
Ozi ahụ ya bụ onyeisiala nọrọ n’Abụja wee gbasaa, bụ nke gazùrù ala Nigeria niile, ma bụrụkwa mgbasaozi izugbe nke abụọ ọ na-eme bànyere ya bụ ọrịa, ka o mechaara nke mbụ n’abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Maachị ahọ a.
N’okwu ya na mgbasaozi izugbe ahụ o mere nso nso a, onyeisiala kèlèrè ụmụafọ ala Nigeria maka ndidi, ogologo ntachiobi na nrubeisi ha nyegara ntụziaka dị iche iche gọọmentị wepụtara banyere ọrịa nje korona.
Ọ fọkwara ekele n’ụkpa wee bunye ndị ọrụ ahụike ala Nigeria, ndị ọrụ nchekwa, ndị ndu okpukperechi dị iche iche, ndị ọchịchị nakwa ndị ọzọ nyegoro aka ma ka na-enyekwa aka n’ụzọ dị iche iche ịhụ na ndị mmadụ rubere isi nyegara ntụziaka ahụ gọọmenti nyere, tụmadụ n’ebe o metụtara iwu onye apụtakwala ezi.
Ọ kwupụtara na ọ na-echu ya ụra, bụ etu ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa ahụ si abawanye n’ike n’ike n’ala Nigeria na na mba ụwa, bụ nke ndị butegoro ya ugbua karịgoro nde abụọ, ebe ndị nwụgoro anwụ karịgoro otu narị puku na ụma iri abụọ.
Onyeisiala Buharị, n’ilekwasị anya n’otu ọrịa ahụ si agbasawanye ugbua nakwa otu ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ala Nigeria n’ime izuụka abụọ ahụ ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ n’ihi ọrịa ahụ, nọkwazịrị na mgbasaozi ahụ wee kwuwaa na ya na-agbatịwanyekwu oge onye apụtakwala ezi ahụ ka ọ dịkwa izuụka abụọ, bụ abalị iri na anọ ọzọ.
O kwuru na mkpebi ahụ hịara ha ahụ tupuu ha mee ya, n’ilekwasị anya n’ụzọ dị iche iche izuụka abụọ nke gwụrụ agwụ siri metụta ụmụafọ Nigeria; ma kwuo na ha mere ya bụ mkpebi maka ọdịmma Nigeria na ụmụafọ ya, n’ihi na ọ na-abụ o metụta ime, o metụta ọnụ.
Ka ọ na-akpọpụtasị ụfọdụ ihe dị iche iche gọọmenti etiti mèrè n’izuụka abụọ gara aga iji bèlatara ụmụ mmadụ ahụhụ ma mekwa ka ihe dịrị ha mfe; ọ kwère nkwa na ha agaghị ada mbà n’ime nke ahụ
O mekwazịrị ka a mara na ya enyela minịtịrị etiti na-ahụ maka ọdịmma ụmụafọ Nigeria ntụziaka ka e tinyekwuo otu nde mmadụ na ndị na-erita urù n’ego ahụ gọọmenti etiti na-akwụ ụmụafọ Nigeria ụwa na-atụ n’ọnụ n’ime oge, nke mezịrị ka ọnụọgụgụ ndị na-erite ya bụ urù ugbua dịzie ndè atọ na narị puku ise.
O kwupụtasịrị mbọ dị iche iche gọọmenti gbagoro na nke ọ ka na-agba iji belata mgbasawanye ọrịa ahụ n’ala Nigeria, gbaa akaebe na a na-enwe agamnihu, ma kwuo na onye ọbụla ka nwekwara ọrụ dịịrị ya n’agha ahụ a na-ebu megide ọrịa nje korona.
Ọ dụzịrị onye ọbụla ka ọ na-atụnye ụtụ nke ya oge niile ma na-agbasikwa mbọ ike irube isi nye ntụziaka ahụ gọọmenti nyere bànyere ịgbanahị ibute maọbụ ikesa ọrịa ahụ.