CHUKWUEMEKA Odumegwu Ojukwu University (COOU), amalitela ịrụpụta ihe e ji akwọ aka na-egbu nje (hand sanitizers) na ihe ndị ọzọ iji nye aka gbochie ọrịa coronavirus.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Greg Nwakoby kwuputara nke a n’Awka oge o duuru ndị nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ ( university managment) wee kesaa ihe ndị e ji egbochi covid-19 maka inyere obodo dị iche iche aka na steeti.
Ihe ndị ahụ gụnyere: ihe ndị a na-agba n’aka (glooves)dị puku atọ, ihe e ji ekpuchi imi,(nose masks) dị otu puku;mkpọ ololo mmiri na-egbu nje(hand sanitizers), dị otu puku; owuru(wool) dị iri abụọ; ihe nnyocha ahụike (themometer) dị iri.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ kwukwara na ndị ngalaba ihe ọmụmụ Natural Science tinyere Entrepreneurial Studies ga-aga n’ihu imepụta ihe a na-ete n’aka na ndị ọzọ,maka ọha obodo, tinyere ndị ọrụ mahadum na ụmụakwụkwọ.
Ọ gakwara n’ihu too Gọvanọ, Willie Obiano, ode akwụkwọ goomenti,Ọkammụta Solo Chukwulobelu,na ndị ọrụ mahadum maka mbọ ha.
O kwuru na mgbe adịghị anya na ọ ga-abụ iwu na onye ọ bụla ga na-ekpuchi imi ya (nose mask)na steeti Anambra.