NdỊ uweojii steeti Enugu anwuchikọọla otu nwoke maka itinye nsi(poison) n’akpa aṅara dị ihe dịka akpa otu narị na iri anọ na atọ.Nke a dapụtara n’ahịa dị n’Enugu.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, onye uweojii na-ahụ maka ọdịmma ha na ndị mmadụ(PPRO) bụ ASP Daniel Ndukwe kwuru na ọ bụ n’Akwata nke ahịa Ọgbete Enugu ka a nwụchikọrọ nwoke ahụ site n’aka Central Police Station Enugu.
O kwuru sị;”Site n’ama ndị mmadụ gbara, e jidere nwoke ahụ ka ọ na-etinye (container of suspected toxic liquid substance)n’aṅara dị akpa kwuru akpa, n’Akwata.
Aṅara ndị ahụ nke dị ihe dịka akpa143 gburu ego dị 729,000 naịra” Otu o sila dị, o kwuru na ha na-aga n’ihu ime nnyocha site n’aka ndị ọ dị n’aka, State Criminal Investigation Department iji chọpụta ebumnuche o ji kpa ya bụ arụ, tinyekwara ịnwụchikọ ndị ọzọ.
Ndukwe kwuru na Komishọna uweojii steeti ahụ, Maazi Ahmad Abdurrahman toro ndị ọrụ nchekwa na ndị na-asọpụrụ iwu obodo nke steeti ahụ maka mbọ ha.