ÒTÙ a kpọrọ ‘Israel Ezue Foundation’ nọrọ na nso nso a wee jiri ihe erimeri dị iche iche wee kwàdo ndị obodo Awa, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Orumba North, dịka gọọmenti gbatịwanyekwùrù oge iwu onye apụtakwala ezi, ka ọ dịkwuo abalị iri na anọ.
Ihe ahụ e kesàrà bụ nke mmadụ karịrị narị abụọ n’ọnụọgụgụ rìtàrà uru na ya, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji belata ntaramahụhụ ụmụ mmadụ n’ime oge a nọ na ya ugbua, dịka Maazị Israel Ezue, bụ onye chọpụtara òtù ahụ, ma bụrụkwa onoowu obodo Awa siri kọwaa.
Ọ kọwara na ya mèkwàrà nke ahụ, iji mee ka ndi obodo ahụ nwee ike nọrọ mma ma na-ekwe oyooyoo dịka ha na-erube isi nye ntụziaka gọọmenti nyere, ka onye ọbụla nọrọ n’ụlọ ya n’ihi ọrịa nje korona.
Ọ kpọkùkwàzịrị ndị ọzọ ihe dịịrị mma ka ha chèta ma nyerịtakwara ndị ha ka mma aka, iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata na ihe ndị mmadụ na-agabiga n’ime oge a, dịka ha na-agbaso ntụziaka gọọmenti.
N’okwu nke ya oge ha na-ekele Maazị Ezue, ụfọdụ ndị ichie na ndị selitere isi n’ọchịchị obodo ahụ, nke gụnyere Maazị Ernest Okafor kpọkùzịrị ọhaneze ka ha nọrọ n’ụlọ ma nọrọ mma, na nrubeisi nye ntụziaka gọọmenti nyere iji gbochie nkesà ọrịa nje korona.
Ụfọdụ ndị nọchitere anya ndị ritara uru n’ihe ahụ e kesàrà ụbọchị ahụ iji belata ọnụọgụgụ ndị mmadụ n’ebe ahụ, nke gụnyere Maazị Friday Odoh (nọchitéré anya ndị abụghị ndị obodo Awa) na Maazị Clement Orji (nọchitéré anya ụmụafọ obodo Awa) kèlèrè nwa amadi ahụ maka ibu ọdịmma ụmụ mmadụ n’obi oge niile.
Ha kpọkùkwazịrị ụmụafọ steeti ahụ ka ha na-akwọ aka ha, na-anọ n’ụlọ, ma na-emekwa ihe niile ahụ gọọmenti kwuru ka a na-eme, dịka ọ dị na ntuziaka dị iche iche e wepụtara iji gbanahị ibute maọbụ mgbasa ọrịa korona.
Ka o mechara ya bụ mmemme, Maazị Israel Ezue, bụkwa onyeisi ụlọọrụ ‘White Gate Investment Ltd.’ nọkwazịrị na nso nso a wee kwụnyere gọọmenti steeti Anambra otu nde naịra n’ịkwado ya n’agha ahọ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa korona n’ime steeti ahụ.
Ya bụ ego bụ nke ọ kwụnyere site n’akara ụlọ ọba ego Fidelity gọọmenti wepụtara maka ịnakọta ego e ji ebu agha ahụ megide ọrịa korona.