… Ọchịchị steeti ahụ etịela iwu onye apụtakwala ezi
DỊKA mba ụwa ka na-agba ghara ghara banyere ịchọ ụzọ a ga-esi memilaa ọrịa nje korona, otu onye ebutela ya bụ ọrịa n’ime steeti Anambra.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ozi ụlọọrụ ‘Nigeria Centre for Disease Control (NCDC)’ kụpụrụ n’abalị ụbọchị Fraịdee gara aga bànyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ ụbọchị ahụ n’ọnụọgụgụ ndị butere ya bụ ọrịa n’ala Nigeria.
Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ gbakwàrà akaebe banyere nke ahụ na mgbasaozi izugbe o mere ụbọchị Satọdee, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kọwaa na ọ bụ Lagos ka nwa amadi ahụ siri wee bàta n’ime steeti ahụ.
O kèlèrè ụmụafọ steeti ahụ, ndị ụka, ndị eze ọdịnala, ndị ndu obodo, na ndị ndu ahịa dị iche iche n’ime steeti ahụ maka ịña ntị na irube isi nye ntụziaka gọọmenti n’ime izuụka abụọ gara aga, bụ mgbe ọ sị ka ahịa niile mechigodi.
Ọ gara n’ihu kelekwa ndị dị iche iche jiri ego, akụrụngwa ahụike, nakwa ihe dị iche iche wee kwàdo gọọmentị steeti ahụ n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ n’agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa ahụ na steeti Anambra.
Iji gbochie mgbasawanye nke ọrịa ahụ n’ime steeti ahụ, Gọvanọ Obianọ gazịrị n’ihu nyegasịa ntụziaka dị iche iche steeti ahụ na ụmụafọ ya ga na-agbasozị malite ugbua dịrị gaba, nke gụnyere ịgbatịwanyekwu oge ndị mmadụ ga-anọ n’ụlọ, bụ nke o mere site n’iti iwu onye apụtakwala ezi, na ịkpọchikọ ebe niile kpam kpam.
O kwukwara na mkpọchi ahụ a kpọchiri ebe niile e si abata n’ime steeti ka dịkwa ìrè ma ka na-agakwa n’ihu, nke na o nweghịzị onye nwere ike ịbata maọbụ pụọ na steeti ahụ, tinyekwuoro na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịdị na-agagharịzị agagharị ugbua, belụsọ ndị nọ n’ọrụ pụrụ iche.
Ọ dụrụ ndị mmadụ ka ha na-akwọ aka oge niile, nọrọ n’ime ụlọ, zèéré mmetụkọsị ahụ, nakwa ihe ndị ọzọ nwere ike itinye mmadụ n’ajọ ọnọdụ ibute ọrịa ahụ.
O nyèkwara ntụziaka ka onye ọbụla nwere ka ahụ si eme ya maọbụ hụ onye a na-enyo ènyo na o nwèrè ọrịa nje korona kpọtụrụ ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasaara ọnọdụ gbanụ gbanụ n’ihe metụtara ahụike na steeti ahụ, bụ ‘Public Health Emergency Operation Center (PHEOC)’ n’akara ekwentị ndị a: 08030953771, 08145434416, 08117567363, 08058967320.
