N’IJI tụnye ụtụ nke ya n’ibelatara ụmụ mmadụ agụụ n’ime oge a e tiri iwu, sị onye apụtakwala ezi n’ihi ọrịa nje korona; Achbishọọpụ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ dayọsiisi Awka (nke ụka Angịlịkan), bụ Achịbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim ekesàála ihe erimeri edị iche iche nyegara ndị ụka n’ime dayọsiisi ahụ.
Ihe ndị ahụ e kesàrà gụnyèrè osikapa, igbe erimeri noduul, achịcha ekoghị eko, mba ji, nakwa mmanụ nkwọchasị aka bụ (hand sanitizer n’asụsụ bekee), ma bụrụkwa nke a nọrọ n’ogige Emmaus House dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra wee kesàá.
Achịbishọọpụ Ibezim, oge ọ na-eme nke ahụ, kọwàra na ọ bụ ihe doro anya na agụụ na-anyụ ụfọdụ ndị mmadụ ịkpakwụ ugbua ọkachasị ndị ọrụ ‘ike kete o rie’, n’ihi na ha enweghịzị ike ịkpata ihe ha na ezinụlọ ha riri ugbua, dịka ha na na-erube isi nye iwu ahụ gọọmenti tìrì ka onye ọbụla lakpuo ma nọrọ na be ya.
Dịka ọ na-enye ndị mmadụ owuwe anya na ajọ ọrịa ahụ agaghị adị ọkpụtọrọkpụ; Achbishọọpụ Ibezim kọwàra na ha bàgìdèrè n’atụmatụ ikesà ihe erimeri ahụ iji nyerịtara ụmụ mmadụ aka, ma kpọkuziekwa ndị ọzụzụ atụrụ, bụ ndị ndu ụka dị iche iche na ndị ihe dịtụụrụ mma ka ha sònye na ya bụ ọrụ obi ebere.
O kelekwazịrị ndị dị iche iche nyere aka n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ nakwa ndị tụnyegoro ụtụ n’ụzọ dị iche iche n’ime ka ụmụ mmadụ nwee ihe oriri n’ime oge a, ma kpee ka Chineke kwụghachi ma goziekwa ha mmaji kwuru mmaji.
Na ntụnye nke ya, onye ndu otu jikọtara ndị nne na ụmụagbọghọ n’ime dayọsiisi ahụ, ma bụrụkwa nwunye Bishọọọpụ Ibezim, bụ Oriakụ Chioma Martha Ibezim nyere Chineke ekele n’isi di ya na dayọsiisi ahụ maka ezi ọrụ ahụ, bụ nke ọ kọwara dịka igosipụta ịhụnanya na ọmaiko n’ebe igwe atụrụ Chineke nọ, ọbụnadị dịka ọ kpọrọ oku ka onye ọbụla tinye aka n’ọrụ ahụ ma tụnye ụtụ nke ya n’ụzọ o nwere ike.
Ọ rịọkwara ụmụnwaanyị ka ha were oge ịnọ n’ụlọ a wee dozie ezinụlọ ha, tute mmụọ ịdịnotu na ịhụnanya na be ha, kwee ka mmụọ Chineke na-achị achị n’ezinulọ ha, ma lekọtakwa di ha na ụmụ ha anya etu o kwesiri.
Na ntụnye nke ya oge ọ na-ekele ekele, onyeisi oche ‘Diocesan Clergy Association’ na dayọsiisi ahụ, ma bụrụkwa Achịdikin nke, Ichida Achịdikinri, bụ ‘Venerebụụl David Monanu mere ka a mara na ihe ndị ahụ e kesaara ga-enye aka ịbụ ihe agbamume nyegara ndị ụka ketara òkè na ya, maka na ọtụtụ n’ime ha na-agabiga ihe nhịa ahụ n’ụzọ dị iche iche ugbua n’ihi ọrịa nje korona nakwa iwu onye apụtakwala ezi ahụ gọọmenti tiri.
Venerabụụl Monanu fọkwazịrị ekele n’ụkpa wee bunye Achịbishọọpụ Ibezim na dayọsiisi ahụ maka ime ka ihu ọchị waa ụmụ mmadụ, site n’ịbàgide na ya bụ ọmarịcha ọrụ obi ebere.