GỌỌMENTI steeti Anambra, site n’aka ụlọọrụ ya na-ahụ maka njem okporo ụzọ anwụchiela ụgbọala si Awka achọ iburu ndị mmadụ gaa steeti Lagos na steeti ndị ọzọ dị iche iche, maka ịda iwu gọọmenti.
Ndị a bụ ndị e jidere oge Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Christian Mmadubuko na ndị òtù ọrụ ya na-eme ngagharị na njem nleta na mpaghara ọdụ ụgbọala nakwa ebe ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ, iji ịmata ka ndị mmadụ si erube isi nye ntụziaka ahụ gọọmenti Anambra nyere, sị onye apụtakwala ezi.
N’okwu ya banyere njide ahụ e jidere ndị ahụ, Dọkịta Madụbuko gosipụtara obi mwute ya banyere akparamagwa ụfọdụ ndị na-anyà ụgbọala nakwa ndị ọzọ na-achụ ego na steeti ahụ, banyere etu ha si enupù isi nye ntụziaka gọọmenti nyere, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ na-etinye ndụ ụmụ mmadụ n’ihe égwù na ajọ ọnọdụ ihe izè ndụ ibute ọrịa korona, n’ihi ego nke ụwa.
Dịka o siri kọwaa, gọọmenti steeti ahụ, site n’aka ụlọọrụ ya, enyebụọla ntụziaka ka ọdụ ụgbọala niile dị na steeti ahụ mechigodi ugbua, ma nọrọkwa na nso nso a tie iwu, sị onye apụtakwala ezi, n’ihi ọrịa nje korona.
Ma, ọ gbarụrụ ihu na n’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị mmadụ kachiri ntị na-eme ihe megidere ntụziaka na iwu ahụ gọọmeti nyere.
Ọ sịkwazị na a ga-agbasò usoro iwu steeti ahụ bàyere ọrịa COVID-19, bụ ‘Anambra State COVID-19 Law’ wee kpee ndị ahụ e jidere nà ọdụ ụgbọala ahụ ikpe n’oge adịghị anya, n’ihi ihe ahụ ha mèrè.
Kọmishọna Madubuko kwuru na ya ekweghịdị na ndị mmadụ ka nwere ike ịdị na-eme njem ugbua ma na-aga mpaghara dị iche iche n’ala Nigeria n’agbanyeghị ihe dị iche iche na-ekwo ugbua maka ọrịa korona.
O jikwazịrị ohèrè ahụ wee dọọ ndị ndị mmadụ aka na ntị, tụmadụ ndị nwere ọdụ ụgbọala, ndị ji ụgbọala achụ ego, nakwa ndị na-eme njem ka onye ọbụla lakpuo be ya ma nọrọ n’ụlọ ya, n’irube isi nye ntụzuaka na iwu ahụ gọọmenti steeti Anambra tìrì, sị onye apụtakwala ezi, n’ihi na nke ahụ bụ maka ọdịmma ha na mmadụ ibe ha.