KA Ọ DỊ TAA, eze ọdịnala obodo Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anambra East, bụ Igwe Mike Idigo enyela gọọmenti steeti Anambra ego dị otu nde naịra, iji kwàdo ya n’ibuso ọrịa nje korona agha n’ime steeti ahụ.
Igwe Idigo, onye ọ bụ ya na ndị ichie ya soro wee bịa n’obi gọọmenti dị n’Awka inyefe ego ahụ n’aka òtù ọrụ ahụ gọọmenti guzobere maka ya bụ ọrịa, mèrè ka a mara na ọ bụ ya na ndị ichie ya tụkọrọ arò ọnụ, wee hụ na ọ bụ ihe kwesiri omume, bụ ịkwàdo gọọmenti na ya bụ agha ọ na-ebu megide ọrịa ahụ, kemgbe ọnwa gara aga.
O kwupụtakwara ezi olileanya o nwere na steeti ahụ ga-enweta mmeri na ya bụ agha, ọbụnadị dịka ọ dụrụ Ndị Anambra ọdụ ka ha dọnyere gọọmenti ukwù n’ime nke ahụ, site n’ịkwàdo ya na irube isi nye ntụziaka dị iche iche o nyere bànyere ọrịa ahụ.
Onye nabatara ya bụ ego n’aha ọchịchị steeti ahụ ma bụrụkwa ode akwụkwọ ukwu steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ kèlere Igwe Idigo na ndị ichie ya maka nzọpụ ụkwụ ahụ.
Ọ kọwara na obi dị gọọmenti steeti ahụ ụtọ banyere nkwàdo dị iche iche ọ na-enweta site n’aka ụmụafọ Anambra na ụlọọrụ dịgasị n’ime steeti ahụ, ma kwe nkwa na gọọmenti ga-etinye ihe ndị ahụ n’agha ahụ a na-ebu n’ụzọ ziri ezi.