COVID 19 – Onyeisiala agwala ndị nta akụko ya ka ha si n’ụlo na-arụgodị

0
142
Buhari

ONYEISIALA Nigeria bụ Muhammadu Buhari agwala ndị ntaakụko na-arụrụ ha orụ (media staff and state house correspondents), bụ ndị bịara olili Abba Kyari (Chief of Staff), ka ha si n’ụlo na-arụgodi orụ wee ruo abalị iri na ano.

   Ka anyị cheta na Kyarị nwụrụ na Fraidee izuụka gara aga na Lagos, ebulota ya Abuja lie ya ebe olili ozu, Gudu cemetry ụbochị ụka dịka e kpechaara ya ekpere n’ụlo ya na Satodee.

Ozi ndụmodụ nke Attah Esa bụ osote onyeisi mgbasaozi ( Deputy Director of information), tinyere aka na ya kwuru sị ka ndị nta akụko ahụ hapụgodu ịbịa orụ n’obi goomenti ala anyị, State House, Abuja wee ruo abalị iri ano, tinyekwara na ha ga-elebara ahụike ha anya dịka o kwesịrị.

Tupu nke a, onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisiala (SSA), n’ihe gbasara mgbasaozi bụ, Garba Shehu adịla na mbụ kwuo na nke ahụ bụ maka igbochi coronavirus.

Na mmalite coronavirus n’Abuja, e webilatara onụogụ ndị ntaakụko na-ahụ maka ihe na-eme n’isi obi goomenti.

GUO:  Buharị kwesịrị ịga zuo ike – Oyedepo

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here