N’EZIOKWU, ịhụnanya nne nwere n’ebe nwa no dị egwu. Ya mere otu nwaanyị azopụtala nwa ya n’aka agụiyi bịara igbu ya.
Nwaanyị ahụ gbara afo iri ato, aha ya bụ Maurina Musisinyana ka e kwuru na o hapụrụ ụmụ ya abụo n’akụkụ orimiri Runde nke dị na Zimbabwe ka ha gwube egwu dịka o gara ịkụ azụ.
Ka nwaanyị ahụ no na mmiri akụ azụ, ọ nụrụ mkpu wee gbara gaba. Mgbe o ruru, o hụrụ ka agụiyi bu nwa ya nwoke, Gideon gbara afo ato agbapụ.Odogwu nwaanyị ahụ wakporo agụiyi ahụ ozugbo, were otu aka pịchie ya imi nke mere ka o hapụ nwata ahụ.Otu o sila dị, agụiyi ahụ tara ya n’aka ebe e buru nwata ahụ nke ahụ ya bụ obara obara, nke ekuteghịzi ume nkeoma gaa ụloogwụ. Ma ka o dị ugbu a, nwata ahụ agbakeela.
Murina, onye nke si Chihosi Chiredzi kwuru sị, “Apịchisiri m imi agụiyi ahụ ike bụ ihe nke m mụtara site n’aka ndị okenye oge tere aka. Eji m aka nke ozo wee napụta ya isi nwata ahụ nke o tadosiri ike.Ma ruo taa, ekwetabeghị m na azopụtara m nwa m.”
Otu o sila dị, a na-akowa na agụiyi na-awakpo ihe karịrị mmadụ narị abụo na Runde River, afo o bụla.