Ụlọọrụ Grand Cereals nọrọ na nso nso a wee jiri ihe erimeri dị iche iche wee kwàdo gọọmenti steeti Anambra iji nweta mmeri n’agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ.
Ihe dị iche iche ụlọọrụ ahụ butere gụnyèrè mmanụ e ji esi nri, igbe ihe ọñụñụ ‘corn flakes’ karịrị narị abụọ na iri ise, tinyere akpati àkwá karịrị narị ise.
Oge ọ na-enyefe ihe ndị ahụ n’aka gọọmenti n’Awka n’aha ụlọọrụ ahụ, onye mere nke ahụ, bụ Maazị Eno Brown kwupụtara na e wezuga ọkpụkpọ òkù gọọmenti Anambra kpọrọ maka nkwàdo ọhaneze na ụlọọrụ dị iche iche, na ihe ọzọ kpaliri ha inye ya bụ onyinye nkwàdo bụ maka etu gọọmenti na ụmụafọ steeti ahụ sigoro kwàdo ma na-emekwata ụlọọrụ ahụ mma kemgbe otu ahọ gara aga ọ nọgoro na ya bụ steeti.
O kwere nkwa na ụlọọrụ ahụ ga-aga n’ihu ịkwàdò gọọmenti n’agha esepughị aka ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ, ma kpọkuziekwa ọchịchị steeti ahụ ka o jisie ike na nke ahụ, iji hụ na ya bụ ajọ ọrịa agbasàghị maọbụ mee mkpamkpa na steeti ahụ dịka ọ dị n’ụfọdụ ebe ndị ọzọ taa.
Ka ọ na-anabata ihe onyinye nkwàdo ahụ n’aha gọọmenti Abambra, ode akwụkwọ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ kèlèrè ụlọọrụ ahụ maka ịña ntị n’ọkpụkpọ oku gọọmenti kpọrọ ma gbatakwara ya ọsọ enyemaka.
O jikwazịrị ohere ahụ wee kelee ndị dị iche iche nyegoro gọọmenti steeti ahụ nkwado n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche iji sị ya ‘gaba n’ihu nà égwù adịghị’ n’agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa korona, ọbụnadị dịka ọ rịọrọ ndị aka ji akụ na ụlọọrụ ndị ọzọ nọ n’ime steeti ahụ, bụ ndị atụnyebeghị ụtụ nke ha n’ịlụ ọgụ ahụ, ka ha mee nke ahụ, n’ihi na ọrụ dị etu ahụ abụghị ihe e kwesiri ịhapụrụ naanị gọọmenti, n’ilekwasị anya n’oge a nọ na ya ugbua.
Ọkammụta Chukwulobelụ dụkwazịrị ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha na-agbaso ma na-erube isi nye ntụzika ahụ gọọmenti nyere, dịka ụzọ kacha mma isi belata mgbasawanye nke ajọ ọrịa korona.