DỊKA idobe onwe anyị na gburugburu ebe anyị bi ọcha bụ ihe di oke mkpa n’ikwusi na izere ibute ọrịa, onyeisi ụlọọru na-ahu maka mkpọcha na nzacha, na ijikwa atịtị na steeti Anambra bụ ụlọọru “Anambra State Waste Management Authority”, ASWAMA (n’aha ịchafu bekee), bu Maazị Amechi Akorah ekwuola na ụlọọrụ ahu ewelitekwuola aka n’ịkwalite ọrụ ya maka ezi onodo adịmocha gburugburu n’ime steeti ahu.
Ọ kọwara sị na e meghi mkpocha na nzacha izugbe n’ime onwa a, n’ihi ntuziaka “Onye apụtakwala ezi” ahụ gọọmenti nyere dika ụzọ kacha mma iji gbochie mgbasawanye ọrịa Korona. Ọ gara n’ihu sị na ụlọọrụ ahụ na ụlọọrụ ndi ozo ọrụ ha bụ maka mkpọcha na nzacha ga na-agba mbọ ịhu na adịmọcha gburugburu na steeti ahụ bụ nke kwu chim ma bụrụkwa igede.
Ọ sị “Taata anyị enweghị mkpocha na nzacha nke ọnwa a n’ihi ọ bụrụ na anyị mere ya, ihe ọ putara bụ na anyị esonyeghị n’iwu gọọmenti steeti nyere maka igbochi mbawasa ọrịa korona. Ihe anyị mere bụ na anyi welitere aka nke ọma, n’etu anyi si arụ ọrụ.”
Maazị Akorah jiri ohere ahụ gwa ndi mmadu ka ha ghara ịdịna-edokọba atịtị n’ebe ha bi, n’ihi na o nwere ike ịdọta anumanu, dika oke na ndi ọzọ na-ebufe mmadu ọrịa. O kwukwara oke mkpa ọ di ndi mmadu ijikọ aka ọnụ na-esonye n’ikwalite ọnọdu adimọcha ma na idobe ebe niile och,a iji gbochie ọrịa di iche iche dịka nke Korona, tinyere uwa na gbagharia.
Onyeisi ụlọọrụ ASWAMA mere ka ndi mmadụ matakwa ozo na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ kwụdosiri n’igbochi ọrịa korona n’ime steeti ahụ.
Ọ gwakwara ọhaneze, ka onye ọbụla kechie ngwa ihe di iche iche ha ji echekwa onwe ha imaka ọrịa korona (nke gunyere ihe e ji ekpuchi imi, nke aka na ihe ndi ọzọ di etu ahụ) n’akpa ma ga dobe ha ebe di iche iche a na-awufu ahịhịa, bụ ebe ndi oru ASWAMA ga-aga buru ha tufuo.
Ọ sị na ọ bụ ọrụ dịịrị ndi na-ahu maka mkpocha na nzacha ịhụ na a ghafuru ahịhịa ahu n’ebe ikpeazụ o kwesiri, dịka usoro ndi ọrụ ‘National Environmental Standards and Regulations Enforcement Agency’( bụ NESREA n’ aha nkenke) siri kwuo.
Kemgbe ihe gafere izuụka abụọ gara-aga ndi ọru ASWAMA na ndi orụ ha bụkwa idobe gburugburu ocha, nọ na-azachasi ma na-ekpọchasi akụkụ di iche iche gunyere ụzọ gara Enugu-Ukwu, Aguleri, Zik ‘Avenue’ gara ahia Eke- Awka, ihu Wintex Ifite ‘Downtown’, Okpuno, Unizik ‘junction’ na ebe ndi ọzọ di iche iche, ma na-ebupụsi ihe ndi dachiri ụzọ ebe mmadụ si aga.