OGONNA, gbara afọ iri na anọ: Goomenti kwesịrị igbochi nsogbu a site n’ịhọpụta ndị ga na-aga n’ụlọakwụkwọ na-elete ahụike ụmụakwụkwọ. Imechi ụlọakwụkwọ abụghị ụzọ kacha mma.
Imechi ahịa kpamkpam adịkwaghị mma kama ka onye ọ bụla dọba bọketi mmiri, ncha na ihe na-egbu nje bekee kpọrọ sanitizer, ka agụụ hapụ igbu ndị mmadụ.
Ana m akpọku ọha na eze ka ha sọpụrụ iwu niile e weputere iji gbaara ajọ ọrịa coronavirus ọsọ makana mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya.
Onyedịka, gbara afọ iri na isii: Onye ọ bụla kpachara anya n’ihi na coronavirus ajọka.Gbaara ịnọ mmadụ oke nso ọsọ ọkachasị mgbe onye ahụ na akwa ụkwara.
Somtochukwu,gbara afọ iri na atọ: Ihe kacha mkpa n’oge a bụ ekpere.
Imechi ahịa adịghị mma n’ihi na agụụ ga-egbu ndị mmadụ.
Ngọzi,gbara afọ iri: Ndị mmadụ kwesịrị ịba ụlọ dịka iwu kwuru n’ihi na ejighị ihe e ji qgba na ntị agba n’anya.
Chiọma, a maghị afọ ole ọgbara: Achọrọ m ka a nọrọ ọnọdụ a ruo ọnwa isii ka anyị were nọtee aka n’ime obodo anyị a nke anyị lọtara izuụka gara aga. Ọbụ mụ sị ndị China ha bute coronavirus.
Azụka,gbara afọ asatọ: Ọnọdụ a dị njọ, biko achọrọ m ka e mepee ụlọakwụkwọ ka anyị gabakwa akwụkwọ.