AKA na-achị steeti Anambra bụ Willie Obiano (Akpokuodike), ekwuputela na a ga-akwanyere ụfọdụ ndị orụ ahụike ugwu pụrụ iche maka ike ha kpara banyere ịzọta ndụ ma gbochie COVID-19 na steeti Anambra.
Ndị ahụ a ga-akwanyere ugwu gụnyere dokịnta ano, noosụ abụọ, otu onye na-ahụ maka ọgwụ (pharmacist), onye nhicha (cleaner) na onye okwo ụgboala ambụlansị. Ha bụ ndị kpogara onye orịa ahụ n’ebe a na-elekota ha anya. A ga-enye ha nkwanye ugwu a pụrụ iche iji kwado ezi orụ.Govano mgbe o na-ekwuputa nke a kwuru na ego ga-esokwa n’ihe a ga-enye ha.
Govano kwuru sị; “Enwere m olile anya na nke a ga-agba ndị orụ ahụike ume iji mee nkeoma karịaa n’odịnihu.Anyị ga na-aga n’ihu na-akwado ndị orụ ahụike anyị, ndị bụ isi sekpụ ntị n’agha a na-ebu megide nsogbu a.”
Ọ gara n’ihu kpokuo ndị mmadụ ka ha soro nzo ụkwụ goomenti wee leruo anya na ndụ ha, tinyere ndụ ndị nke ha.
O ji obi añụrị kwuputa na nwoke ahụ e nyochara alakwurula ezinaụlo ya, tinyekwara na mmadị iri ato na isii ahụ ha na ya gakoro ebughị nje coronavirus.