COVID-19: Ndị Anambra ekwupụtala uche ha maka ịmaghepu ụfọdụ ihe a machiri

0
160
Maazị Bob-Manuel Udokwu (n’azụ) na ndị ọzọ bịara ụka oge a maghepuchara iwu onye apụtakwala ezi.

IGBO sị na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo.

Ka ọ dị taa, dịk aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maghèpùrù ụfọdụ ihe dị iche iche a màchìrì na ụfọdụ iwu e tiri maka ihi ọrịa korona, ụfọdụ ụmụafọ steeti ahụ ekwupụtala uche ha banyere nzọpụ ụkwụ ọhụụ ahụ.

N’okwu ya bànyere nke ahụ, Chaplenu nke ụlọ ụka ‘Chapel of Redemption’, mahadum Unizik Akwa, bụ Venerebụụl Benson Udezo kọwàra ya bụ ihe dịka nke kwesiri ekwesi na nke magburu onwe ya, ebe ọ bụ na mpụtàrà nnyòcha ikpeazụ ahụ e mèrè nwa amadi ahụ bu ọrịa korona na steeti ahụ na-ekwu na o bughịzị ya bụ ọrịa, tinyekwuoro na mpụtàrà nnyòcha nke e mekwara ndị ọzọ si na steeti ahụ na-egosikwa na ha ebughị ya bụ ọrịa.

Venerebụụl Udezo kèlèrè Chineke maka amara ya n’isi steeti ahụ, ma kelekwa ọchịchị steeti ahụ maka etu o siri buso ọrịa nje korona ahụ agha n’ime steeti ahụ, ma werekwazie ohèrè ahụ dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ, ka ha gharakwa iji maka mmaghèpu ahụ gọọmenti maghaghèpuru ụfọdụ ihe wee na-ebirizị ndụ etu o siri masị ha.

Ọ gwara ha ka ha gaa n’ihu irube isi ntụziaka ndị ọzọ dị iche iche gọọmenti nyere dịka ụzọ isi gubanahị mbata maọbụ mgbasawanye nke ọrịa ahụ n’ime steeti ahụ ọzọ, nke gụnyere ịkwọchasị aka ha oge niile, ikpuchi imi, ịnọpụga n’ebe mmadụ ibe ha nọ, tinyere ihe ndị ọzọ gọọmenti kwùrù ka a na-eme.

Ọ dọkwara ndị mmadụ na-ezu, na-akpamù maọbụ na-ejikpàdo ihe dị iche iche e kwuru ka e kesaara ụmụ mmadụ iji beleta ahụhụ ha na-ata n’ihi ọrịa korona aka na ntị, ka ha zèéré ma sepu aka n’ime ihe dị etu ahụ n’ihi na nke ahụ pụrụ iwetara ha abụmọnụ maọbụ mee ka iwe Chineke dakwasị ha.

GUO:  A kpọkuola ndị Anambra ka ha tụnyere APGA na ntụliaka ụbọchị Satọdee

Ọ dụkwazịrị gọọmenti ọdụ ka o jisie ike n’ọrụ n’agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa korona, iji merie ya bụ ọrịa.

N’akụkụ nke ya, otu onye a mà àmá n’ime éjìjé, ma bụrụkwa nnukwu onye enyemka pụrụ iche nye gọọmenti n’ihe gbasaara mgbasa ozi nke ihe eji aka emepụta bụ Maazị Bob-manuel Udokwu bunyèkwàrà gọọmenti Anambra Steeti Anambra ụkpa ekele maka etu o si lụọ ma ka na-alụkwa ọgụ ka nwoke megide ọrịa korona n’ime steeti ahụ, bụ nke mezịrị na ya bụ ọrịa adịghịzị n’ime steeti ahụ ugbua, dịka mpụtàrà nnyòcha e mèré na nso nso a sìrì gosi.

O mèrè ka a mara na tupuu aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Obianọ amaghepù ụfọdụ n’ime iwu ahụ e tiri maka ọrịa korona n’ime steeti ahụ, wee kwuo ka ụmụ mmadụ na-agagharịzịrị onwe ha, na nke ahụ gosiri na o zùtèrè ma nụtachaa ọnụ mmiri okwu na echìchè òtù dị iche iche nakwa ndị na ọzọ e ji okwu ha agba izu n’ime steeti ahụ banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ, tupuu e wee kwekọrịta ime mmaghepu ahụ.

Dịka ọ na-akọwa na ụdị nleru anya gọọmenti lerùrù nà nchukwa o chùkwàrà onye ahụ butebụrụ ọrịa ahụ n’ime steeti ahụ bụ ọkacha mma, ma bụrụkwa nke a hụtụbeghị ụdị ya n’ebe ọbụla; Maazị Udokwu gàkwàrà n’ihu wee katọọ etu ụfọdụ ndị mmadụ si akụgharị asịrị bànyere ya bụ nwa amadi,

 na-àsị na o bughị ya bụ ọrịa, ebe ụlọọrụ NCDC kwugòrò gbowam na mpụtara nnyocha e mere na-egosi na nwa amadi ahụ bù ya bụ ọrịa n’ezie

N’ihe gbasaara etu ndị ọrụ nchekwa si anara aka azụ ma na-ahapụ ndị mmadụ ka ha gafèé ókè ala steeti ahụ na-agbanyeghị na gọọmenti nyèrè iwu ka a kpọchie ókè ala niile kpam kpam;

GUO:  Ndị NASS ewepụtala ụgwọ ọnwa abụọ ha maka ibuso COVID-19 agha

Maazị Udokwu kọwara nke ahụ dịka ịdà mbà na ngharịpụ n’ebe ndị ọrụ nchekwa ahụ nọ, ma kọwaa ya dịka ihe jogburu onwe ya, n’ihi ọtụtụ ọghọm na ihe égwù dị iche iche nke ahụ nwere ike iwètara ụmụ mmadụ.

Ọ katọzịrị ndị na-eme ihe dị etu ahụ, ma kpọkuo gọọmenti na ndị isi ọrụ nchekwa dị iche iche ka ha tinye anya na nke ahụ, iji hụ na ha bụ ndị ọrụ nchekwa oji akpa eli ozu sepùrù aka n’ajọ ọrụ ahụ, ma rụọ ihe gọọmenti ziri ha ka ha rụọ n’ebe ahụ.

Na ntụnye nke ya, otu onye na-etinye ọnụ n’ihe metụtara ọhaneze na ọchịchị obodo, bụ Maazị John Ifejirika katọrọ etu ụfọdụ ndị mmadụ siri hụta oge ọrịa korona a dịka oge iji tinye aka n’ihe arụrụala dị iche iche, oge ime mpụ nakwa oge ịkpa ego na ịba ọgaranya site n’ụzọ iwu akwadòghị, nakwa n’ụzọ imegide mmadụ ibe ha.

Ọ sị na ndị ahụ na-esikwazị n’ụzọ dị etu ahụ mee ka mbọ gọọmenti na-agba maa afọ n’ala ma gharakwa ịmịta mkpụrụ a tụrụ anya.

Ọ kpọkùzịrị gọọmentị ka o wepụta ụzọ kacha mma ọ ga-esi na-eleru anya ma na-achọpụta nà ndị ọrụ nchekwa, ndị isi ahịa na ndị òtù ọrụ dị iche iche e zìgàrà itinye amụma iwu dị iche iche n’ọrụ maka ọrịa korona, ọ nà-arụkwa ihe e zigara ha ebe ahụ ka ha rụọ, kà ha ọ nà-emere ihe ọzọ masịrị ha n’ebe ahụ.

Maazị Ihejirika kwukwazịrị na ọrịa korona bụ obere ihe nrụtụaka nàkwà nkwadobe nke ihe ụwa ga-agabiga oge onye nwe ụwa n’onwe ya bụ Chineke ga-awụcha ịkpọrọ ndị nke ya laa n’igwé, ọ ma kpọkuzie onye ọbụla ka o sepu aka na mmehie ma makụọ Chineke, n’ihi na mwèli nke ndị nsọ aghàghị iwèrè ọnọdụ n’oge adịghị anya malite ugbu.

GUO:  Mahadum COOU amalitela ịrụpụta sanịtaịza

Ọ dị ncheta na Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ n’isi ngwụcha izu ụka gara aga wee maghepu iwu onye apụtakwala ezi nakwa ụfọdụ iwu ndị ọzọ gọọmenti steeti ahụ tiri maka ọrịa korona.

Ya bụ Gọvanọ kwuru nyere ntụziaka ka ụka malitekwa ofufe nrò, kwuo ka ahịa nri na ahịa ọgwụ dịgasị na steeti ahụ mepee, kwuo ka ebe niile e si abata n’ime steeti ahụ ka nọrọkwa na mmechi, ma kwuo ka onye ọbụla ga-apụta iro gbaa mbọ hụ na o kpuchiri imi na ọnụ ya, tinyere irube isi nye ntuziaka ndị ọzọ dị iche iche e nyere dịka ụzọ kacha mma isi gbanahị ọrịa korona.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here