ỤNYAAHỤ bụ wenezdee onwa Epure dị na mkpụrụ ụbochị iri abụo na iteghete ka e guzobere (installation) Most Rev. Peter Eberechukwu Ọkpareke dịka bishop ụka katolik dayosis Ekwulobia.Ọ bụ na St Joseph Catherdral Ekwulobia ka o noro kpotụo.
Ka anyị cheta na Pope Francis kewapụtara dayosis Ekwulobia site n’Awka ka onwa Maachị dị n’abalị ise n’afo a bụ 2020.
N’ihi nsogbu korona, ekweghị ka igwe mmadụ zukoo maka oke mmemme ahụ, ya mere o bụ ndịisi ụka na ndị kwesịrị ịno na ya bịara, maka otito nke Chukwu.
Otu o sila dị, a haziri ya nkeoma dịka ụwa niile siri n’usoro nzikorita ozi ogbara ohuru wee kirie ya.