N’IJI kwadobe maka imepegharị ahịa iri isii na atọ dịgasị na steeti Anambra, gọọmenti steeti ahụ achịkọbala nkuzi pụrụ iche maka ndị òtù ọrụ dị iche iche ga-ahụ na e tinyere amụma iwu gọọmenti n’ọrụ ma na-erubekwa isi nye ntụziaka dị iche iche gọọmenti steeti ahụ nyèrè n’ahịa nakwa ọdụ ụgbọala niile e nwere na steeti ahụ.
Ndị so na òtù ọrụ ahụ pụrụ iche e nyere nkuzi ahụ gụnyèrè ndị ndu ahịa dị iche iche dị na steeti ahụ.
N’okwu ya na mmemme inye ọzụzụ ahụ, ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobe kọwara na ọrụ chere ndị ahụ n’ihu bụ ịhụ na ndị na-azụ maọbụ na-ere n’ahịa dị iche iche ha na-elekọta gbasòrò ma rube isi n’ozuzu oke nye ntụziaka ahụ gọọmenti, ụlọọrụ ‘Nigerian Centre for Disease Control’ (bụ NCDC n’aha ịchafụ bekee) nakwa ụlọọrụ ahụ ike mba ụwa, bụ WHO nyèrè dịka ụzọ kacha mma isi gbochie mbata maọbụ mgbasa ọrịa korona.
Ọ kpọkùzịrị ha ka ha gbaa mbọ hụ na ha rụrụ ọrụ nke ọma dịka a tụrụ anya n’aka ha, n’ihi oke mkpa nke ahụ dị n’igbochi ọrị korona na steeti ahụ.
Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahịa na ịtụ mgbere ahịa, bụ Maazị Uchenna Okafor dọrọ ndị òtù ọrụ ahụ aka na ntị ma mee ka ha mara na a ga-akpọchi ahịa ọbụla na-agbasoghị maọbụ rube isi nye ntụziaka gọọmenti n’ozuzu oke, n’ihi na gọọmenti ekpebiala ịhụ na e nweghịzị onye ọbụla butere ọrịa ahụ ọzọ n’ime steeti ahụ.
N’aka nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala, bụ otu onye n’ime ndị nyere nkuzi n’ọgbakọ ahụ dụrụ ndị òtù ọrụ ahụ ka ha ghara ime maọbụ tinye aka n’ihe ọbụla ga-eme ka mbọ gọọmenti na-agba igbochi ọrịa ahụ n’ime steeti ahụ maa afọ n’ala.
Ọ kọwakwaara ha ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere ọrịa korona, ọ kachasị ihe ọ bụ kpọmkwem, etu o si agbasa nakwa ụzọ kacha mma isi gbochie ya.
Ụfọdụ ndị ọzọ dị iche iche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyekwàrà na ya bụ ọgbakọ nkuzi, tinyekwuoro otu onye sitere ụlọọrụ NCDC.