AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agaala leta ka ọrụ si aga n’okpuru ụzọ ahụ siri
Mmịata-Anam gaa Nzam n’okpuru ọchịchị ime obodo Anambra West.
Ya bụ okporo ụzọ bụ nke ogologo ya ruru kilomita iri na ótù ma bụrụkwa nke nwere àkwà ogologo ya ruru mita otu narị na iri abụọ.
N’okwu ya oge ọ letachara ka ya bụ ọrụ si aga, Gọvanọ Obianọ kọwàrà ụzọ ahụ dịka nke e si na ya abanyegasị n’ime obodo dị iche iche e jiri ọrụ ugbo mara, ma kwuo na ọ bụrụ na a rụchaa ya, na ọ ga-enye aka ime ka ọrụ ugbo na-agawanye n’ihu na mpaghara ahụ,
ma nyekwa aka n’ibubàtasị ihe dị iche iche a kọpụtàra n’ugbo ebe ahụ n’ime ahịa dịgasị na steeti ahụ, karịa ibupu ya site na steeti Kogi maọbụ steeti ndị ọzọ abụghị Anambra. Ọ sịkwa na ime nke ahụ ga-enye aka ịkwàlite ego a na-enweta n’ime steeti ahụ.
O kwukwara na ya bụ ụzọ ga-enyekwa aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ịkwàlite ọnọdụ mmepe na mpaghara ahụ, ma kwuo na nke ahụ so na nkwà o kwèrè oge ọ batara n’ọkwa ọchịchị, bụ ime ka ezi ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ bata na steeti ahụ, nakwa imepe ime obodo dị iche iche e si na ya akọpụta erimeri na steeti ahụ.
Gọvanọ Obianọ gosipụtakwara afọ ojuju ya bànyere etu ọrụ si aga n’ebe ahụ, ma kwekwazie nkwà ịhụ na a rụchàpụrụ ya bụ àkwà na okporo ụzọ ma gbapee ya tupu ọchịchị ya apịachie akwụkwọ.
Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor kwùrù na ụlọọrụ ya wàtàrà ọgọdọ ịhụ na a rụrụ ya bụ ọrụ n’ogoogo kwesiri ekwesi ma rụchapụkwa ya n’oge a tụrụ anya.
Ọ gbakwazịrị akaebe na onye ji ọrụ ngo ahụ ekwela nkwà na ọ ga-arụchapụ ya bụ ọrụ oge a tụrụ anya, dịka nkwekọrịta e nwere na mmàlite siri dị.
Na mbụ n’okwu ya, onye ji ya bụ ọrụ ngo, nyere nkọwa bànyere etu ọrụ si aga n’ebe ahụ, ma kwuo na ọrụ ga-akụrụ ọnụ n’àkwà ahụ mgbe adịghị anya.