IGBO sị na ọ na-abụ a hụ ihe ka ubi, e ree ọba; ma sịkwa na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.
N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra ekwuwaala hoohaa ma maa ọkwà sị na ya bụ oke mmemme na-ewu èwù e jiri mara ndị Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụ mmemme Imo Awka agaghị ewere ọnọdụ n’ahọ a.
Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara, site n’ozi a kụpụrụ nso nso a n’aha ọchịchị steeti ahụ site n’aka odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobeụ.
Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ọchịchị steeti Anambra mere mkpebì ahụ n’ihi ọrịa nje korona, bụ nke na-akpa mkpamkpa na mpaghara ebe iche iche n’ala Nigeria ugbua, ma na-ebìkwa mba ụwa aka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche.
O kwuru na ịchịkọba nnukwu mmemme dị etu ahụ ugbua adabaghị adaba n’ihi na o megidere ntụziaka ahụ òtù ọrụ ahụ ike mba ụwa (bụ World Health Organisation, WHO) na ụlọọrụ ‘Nigeria Center for Disease Control (NCDC)’ nyere bànyéré igbòchì mgbasà ọrịa korona ahụ, maka na ọtụtụ mmadụ na-adị esonyekarị na mmemme ahụ, bụkwa nke ha na-anọ na ya na-emetụkọrịta onwe ha ahụ, ma na-emekwa ihe ndị ọzọ adabàghị adabà na ntụziaka e nyèrè maka igbòchì mgbasa ọrịa ahụ.
O kwukwazịrị na mmemme ndị ọzọ niile dịkwa ka Imo Awka a na-emekwa na steeti ahụ ka ga-agbaberegodi ugbua wee ruo mgbe ihe bànyere ọrịa korona dàjụrụ.
Ọ kammụta Chukwulobelụ kpọkukwazịrị ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo dị iche iche ka ha buru ozi ahụ n’uche, gbasàkwa ya n’obodo ha dị iche iche, ma dụọ ha ọdụ bànyere nke ahụ, n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị ndu obodo ka a ga-ejide ma o nwee ka ndị obodo ha siri chịkọba maọbụ sonye n’ụdị mmemme dị etu ahụ.
Ọ kpọkuzịrị ụmụafọ steeti ahụ ka onye ọbụla nọọrọ onwe ya, ma gharakwa isònyè na mmemme dị etu ahụ, n’ihi na gọọmenti enyela ndị ọrụ nchekwa ikike itinye ntụziaka na mmàchí ahụ n’ọrụ n’ozuzu oke.
N’okwu dịkwa ka ibè ya, onyeisi ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị John C. Abang akpọkuola Ndị Anambra ka ha rube isi nye ntụziaka mmàchi mmemme ahụ, dịka gọọmenti siri kwuo, n’ihi na nke ahụ bụ maka ọdịmma steeti ahụ na ụmụafọ ya n’izugbe.
Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Mọhammed, site n’ozi ọ kụpụụrụ ohaneze na nso nso a bànyere nke ahụ.
O mere ka a mara na a ga-anwụchikọ onye ọbụla dara iwu ahụ, dịka gọọmenti siri nye ntụziaka, ma kpọkukwazie onye ọbụla ka ọ sọpụrụ ya bụ iwu mmachi ma nọrọ be ya, maka ‘ngara m mmara’ ikpè azụ.