ONYE na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Wilie Obianọ agbarụọla ihu ma kọwakwa na afọ ejughị ya bànyere etu ọnọdụ gbata kwụrụ na etu ihe si aga na mpaghara ókè àlà steeti ahụ na steeti Delta ugbua.
Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ gara njem nleta a kaghị àkà na mpaghara àkwà mmiri Niger dị n’Ọnịtsha, ịmata ka ọnọdụ si aga n’ebe ahụ nakwa etu ndị mmadụ si erube isi nye mmachi ahụ a machiri mmadụ isi na steeti ọzọ bata na steeti ahụ, n’ihi ọrịa nje korona.
Ka o rutere n’ebe ahụ, ọ hụrụ ka ndị mmadụ na ụgbọala dị iche siri kwụkọjuo n’ogologo ebe ahụ ma na-agakwa na ya bụ àkwà mmiri. Nke kacha nke bụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ eyìghị uwe mkpuchi ihu bụ ‘facemask’ bụ nke ọchịchị steeti ahụ nyegoro ntụzịaka ka onye ọbụla yiri tupu ọ pụta ezi.
Ọzọ bụkwa na ọtụtụ n’ime ndị mmadụ ahụ anọsapụghị anọsapụ n’ebe ibe ha nọ (dịka gọọmenti na ụlọ ahụ ike mba ụwa, bụ ‘World Health organisation sikwara nye ntụziaka); onye ọbụla na-emetụkọrịtakwa onwe ha ahụ ka ha nà-àga.
Nke a mezịrị ka ya bụ Gọvanọ gbarụọ ihu, ma gosipụtakwa obi mwute ya banyere ihe ọ hụrụ n’ebe ahụ; o wee nye onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang ntụziaka ka o mechigodi ebe ahụ e si abanye n’àkwà mmiri ahụ, site n’ókè Anambra, na n’ókè Delta, iji belata ọnụọgụgụ mmadụ na ụgbọala na-aga n’akwa ahụ.
O nyekwazịrị ndị ọrụ nchekwa nọ n’ebe ahụ ntụziaka, ka ha dị uchu n’ọrụ ma kpachapụ anya bànyere etu ihe si aga na ya bụ oke ala, iji hụ na ndị mmadụ na-erube isi nye ihe gọọmenti kwuru; ka atụmatụ na agbambọ gọọmenti megide mbata na mgbasa ọrịa korona n’ime steeti ahụ wee ghara ịma afọ n’ala.
Dịka ọ na-echetara ha na ọ bụ naanị ndị nọ n’ọrụ pụrụ iche na ụgbọala bụ ihe dị oke mkpà ka a ga na-ahapụ ka ha gafee ya bụ oke àlà, Gọvanọ Obianọ gwakwara ha bụ ndị ọrụ nchekwa ka ha ghara ikwe ka ụgbọala ọbụla kwụrụ akwụrụ n’elu àkwà mmiri ahụ.
Ya bụ Gọvanọ jikwazịrị ohere ahụ wee gakwa n’okè àlà steeti Anambra na Enugu ileta ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, bụkwa ebe ọ hụrụ ụgbọala ole na ole kwụ n’ahịrị, na-eche ka e nyòchaa ha tupu ha abata n’ime steeti ahụ, mgbe o rùrù.
Ka ọ hụtachara etu ihe si aga n’ebe ahụ, o kwupụtara afọ ojuju ya banyere etu ọnọdụ si aga n’ókè ala ahụ, ma sị na ọ bụ site n’ichekwa oke ala steeti ahụ nke ọma ka a pụrụ isi gbochie ọrịa nje korona ịbata steeti ahụ.
Ọ dụkwazịrị onye ọbụla ka ha na-erube isi nye ntụziaka dị iche iche gọọmenti nyere maka ibelata mgbasa ọrịa ọjọọ ahụ.
Ndị dị iche iche sonyere na njem nleta ahụ gụnyèrè Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang; Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ, bụ Dọkịta Christian Madubuko, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ so n’òtù ọrụ gbanụgbanụ ahụ gọọmenti steeti ahụ guzobere maka ọrịa nje korona.