ỤLỌIKPE (magistrate court) nke dị n’Ado Ekiti adaala otu nwoke nha ego dị puku naira iri anọ (N40,000) maka ejighị akwa mkpuchi ihu (face mask) wee kpuchie ihu ya.
Nwoke ahụ aha ya bụ Vincent Ikechukwu bụ onye izizi a na-enye ụdị ọnọdụ ahụ maka ekpuchighi ihu ya nke bara n’iwu na steeti ahụ kemgbe korona malitere kpaba ike. E kwukwara na ọ ga-arụkwa ọrụ obodo (Community labour) abali atọ, wee tinyere nha nke a dara ya.
Magistrate B.A Oluwasanwi, mgbe ọ na-ekpe ikpe ahụ kwuru na ọ bụ n’ihi ike korona na-akpa, ma kọwakwaa na ọ bụ arụ mmadụ imebi iwu nke e tiri maka ichekwa ndụ onye ọ bụla.
Ihe karịrị otu narị mmadụ nke gụnyere ndị ụkọchukwu ka a dịrịla na mbụ nye ntaramahụhụ dị iche iche na steeti Ekiti maka ịda iwu gọọmentị tiri iji gbochie nkesa ọrịa korona.