OTU nwaanyị aha ya bụ Adisa Fumilola, egbuola nwa o ku n’aka site n’itinye ya n’ime bọkeeti mmiri, ọ nwụọ pịị.
Nwaanyị ahụ gbara afọ iri abụọ na abụọ kwuru na iwe ya o jiri gbu nwata ahụ gbara otu afọ na ọnwa isii bụ maka na ọ bụ ya gbochiri ya ịba mahadum gụọ ihe ọmụmụ banyere iwu (law).
Ọ bụ n’ụlọ ha nke dị na Gowon Estate, Lagos ka ọ nọrọ kpa arụ ahụ ụbọchị Monde ma gaa n’ogige ndị uweojii nye mkpesa.
Dịka ndị uweojii na-agba ya ajụjụ ọ sịrị na ọ bụ onwe mmadụ igba ya gharịị (frustration) tinyere ya n’ịkpa agwa ọjọọ ahụ, ma kwukwaa na nwata ahụ gbochiri ya imezu ebumnobu ya nke bụ ibụ ọkaiwu (lawyer).
Ọ kọwara na otu nwoke aha ya bụ Yusuf Folarin tụbara ya ime oge ha abụọ na-aga akwụkwọ maka ule Joint Admission and Matriculation Board (JAMB). Nwoke ahụ dịka o siri kwu, gọnahụrụ ya ma gwa ya ka o wepụ afọ ime ahụ.
Ka o mechara turu ugo ịbanye mahadum Obafemi Awolowo University, Ile Ife nke dị na steeti Osun ịgụ ihe ọmụmụ banyere iwu, onweghịzị ike imeju ebumnobi ya n’ihi nwata ahụ.
Folarin, onye nke e kwuru na o gosipụtaghị mwute ọ bụla maka arụ ahụ ọ kpara kwuru sị; “Egburu m nwa m ma ga kpesa onwe m n’aka ndị uweojii. Agbajuru m mmiri na bọkeetị, tinye ya n’ime ya, jide ya aka n’isi tutuu ọ nwụọ.
ọ dị ụzọ ihe atọ kpatara m jiri gbu ya. Nke mbụ, enweghị m ego m ji eleta ya anya. Nke abụọ, ike gwuru m, ebe onwe m gbara m gharịị. Ma nke kachanụ bụ na o gbochiri m ịbụ ihe m bu n’obi, nke bụ ọkaiwu. Agaara m ewepu afọ ime ahụ ma nna m dụrụ m ọdụ ka m ghara ime otu ahụ. Onye tụbara m ime gọnahụrụ m. Mụ na nwanne m nwaanyị bi, onye nke enweghị ọrụ, mụ onwe m
, enweghịkwu ọrụ.”
Site n’ajụjụ a jụrụ ya ma ọ ma ihe chere ya n’ihu n’ihi arụ o mere, ọ zara sị; “Ihe kacha mkpa bụ na egbuola m nwa ahụ.”
Otu o sila dị, a kpọgara ya n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ikeja na Tuzdee, ebe kọmishọna ndị uweojii CP Hakeem Odumosu nọ nye ntụziaka na a ga-ahafe ya n’aka ndị na-ahụ maka arụ, State Criminal Investigation Department.