AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano (Akpokuodike) enyela iwu gbasara oge mmadụ ga na-alakpu (curfew) n’obodo Umumbo na Omor dị n’okpuru ọchịchị Ayamelum na steeti ahụ; nke bụ elekere isii nke mgbede wee ruo elekere isii nke ụtụtụ (6.pm – 6.am).
Nke a pụtara ihe n’ozi si n’aka kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkọwara ọhanaeze ihe ha kwesịrị ima bụ Maazị C Don Adinuba n’izuụka gara aga. Iwu a e tiri bụ maka nsogbu na ọgbaghara nke dị n’etiti obodo abụọ ahụ. Mgbe ọ na-akatọ nsogbu ahụ, Adinuba kwuru na nke ahụ megidere ọchịchị Obiano bụ nke gbadoro ụkwụ n’udo na ezi mmekọrịta.
Otu onye n’achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị ntaakụkọ na a ka na-achọ ọtụtụ ndị mmadụ, ndị obodo abụọ ahụ achọ.
Adinuba kwuru na e zigala ndị ọrụ nchekwa gụnyere: ndịuweojii, ndị agha (amị) na Civil Defence (NSCDC) ebe ahụ e nwere nsogbu iji kwalite udo.
O kwuru sị; “Nsogbu a bụ mkparị n’ebe ezi mbọ nke gọọmentị na ndị Anambra na-agba kemgbe afọ isii gara aga iji mee ka steeti a bụrụ eji amaatụ, ọ bụghị sọọsọ steeti kacha nwee ezi nchekwa n’ala anyị kama nke kacha nwee ezi nnabata na mmekọrịta. N’ihi na gọọmentị na-agbalị ike ya niile na nchekwa nke ndụ na akụnụba onye Anambra ọ bụla; ndị niile aka ha dị na nsogbu a ga-eche aka ghọrọ ihe iwu kwuru.
Ka ọ dị ugbu a, e nyela ndị ọrụ nchekwa nke gụnyere ndị Anambra Vigilance Group (AVG) ntụziaka ka ha nwụchikọọ onye ọ bụla aka ya dị na nsogbu ahụ.
Nnwụchikọ na ikpe nke ndị niile aka ha dị na nsogbu Umumbo-Omor ga-abụ ihe nkụzi wee nye ndị ọzọ ga-achọ iweta nsogbu na adịghịnotu n’akụkụ ọ bụla na steeti a.”
Otu o sila dị, Kọmishọna ahụ kwere nkwa ezi ọrụ nke gọọmentị banyere ime steeti Anambra ka ọ bụrụ ebe a kacha nwe udo n’ala anyị, ma gafekwaa.