IGBO sị na onye akọghị anaghị egwute, ma sịkwa na ọ na-abụ a wụnyere dike ji na mbụbọ, o were obi dimkpa mapuo ala.
N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra ekesàála mkpụrụ akụmakụ dị iche iche na ihe e ji akọ ọrụ ugbo nyégárá ndị ọrụ ugbo ruru narị abụọ n’ọnụọgụgụ na Neni, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha, maka ịkọ ọrụ ugbo ahọ a.
N’okwu ya mgbe ọ na-ekesa ihe ọrụ ugbo ahụ n’aha gọọmenti, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ, bụ Maazị Nnamdị Ọnụkwụba, nke ọ bụ Dọkịta Okey Okwuosa nọchitere anya ya, mere ka a mara na atụmatụ ahụ bụ iji kwàdo ma kwàlite ọrụ ugbo n’ime steeti ahụ.
Ọ kọwapụtara mkpa ọ dị, bụ ịkọ ọrụ ugbo nke ukwu, ọ kachasị n’oge ugbua ọtụtụ obodo dị iche iche na mba ụwa tinyezịrị uche n’ọrịa korona, wee gbakụtazie ngalaba ọrụ ugbo azụ.
O kwukwazịrị na ya bụ atụmatụ ga-enye aja ịme ka e nwee nri gbaa nyụụ n’ime steeti ahụ, ma gharakwa inwe ụkọ nri n’ọdịnihu, ọ kachasị oge ihe gbasaara ọrịa nje korona dajụọrọ.
Ọ dụkwara ndị ọrụ ugbo ahụ soro nweta ihe ahụ e kèrè ka ha tinye ya n’ọrụ etu o kwesiri, ma werekwa usoro bụ ịgba wee ọrụ ugbo nke ahọ a, iji wee rụpụta ebumnobi ahụ gọọmenti jiri kesàá ya bụ ihe ubì.
Ndị dị iche iche sonyéré na mmemme ikesà ihe ahụ gụnyèrè onye na-ahụ maka ọrụ ugbo n’okpuru ọchịchị Anaọcha, bụ Oriakụ Uzoamaka Nwoye, onyeisi oche otu ahụ jikọtara ndị ọrụ ugbo n’ala Nigeria (bụ ‘All Farmers Association of Nigeria’, AFAN) ngalaba ya nke Anambra, Maazị Joseph Madubuko, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ.
Ihe dị iche iche e kesàrà ụbọchị ahụ gụnyèrè nri ala (bụ fertilizer n’asụsụ bekee), okpòrò akpụ, mkpụrụ ọka, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.