OTU nwaanyị aha ya bụ Oriakụ Florence Onuobodo atụfuola ndụ ya n’Elele nke dị n’okpuru ọchịchị Ikwerre nke steeti Rivers site na nsogbu igwe mmadụ izọgide ya ụkwụ (stampede) mgbe a na-eke ihe enyemaka gbasara korona nke gọọmenti steeti ahụ wetere.
Dịka a na-eke ihe ndị ahụ, nsogbu nke sitere na ndị mmadụ ikwo ekwo n’igwe dapụtara nke mere ka nwaanyị ahụ bụ Florence gbara afọ iri isii na abụọ tufuo ndụ ya; ebe ụmụnwaanyị anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.
N’okwu ya gbasara ya bụ ọdachi, Eze Okechukwu Okah tara kọmiti haziri ya bụ ihe n’obodo ahụ na otu nwoke aha ya bụ Chief Mike Elechi ụta, n’ihina dịka o siri kwu, a gaara igbochi ọdachui ahụ ma ọ bụrụ na ha leruru anya ma hazie ihe nke ọma.
Okah kọwara na komiti ahụ kpọchibidoro ndị ahụ bịara iketa ihe enyemaka ụzọ, na ọ bụ mgbe ha na-azọ ka ha bata n’ogige ebe a na-eke ihe ka o ji wee mee.
O kwuru sị; “Ihe onyinye nke m bịara tupu nke gọọmenti, ọtụtụ ndị mmadụ ketara ihe, onweghị onye ọ bụla nwụrụ. ihe a dapụtara n’ihi na otu nwoke gwara kọmiti ahụ ka ha bute ihe enyemaka ahụ niile n’ezinaụlọ ya. Anyị ma na agụụ na-agụ ndị be anyị, mana e kwesịrị ka e mee ihe otu o kwesịrị.
Ha họpụtara ndị dị ha mma ka ha bịa kere ihe ndị ahụ, mana ndị chọpụtara ebumnuche ha gbara ụzọ wee bịa n’elekere ise nke ụtụtụ. Mgbe ha malitere nhọpụta ha, ndị ọzọ malitere zọba ịbanye n’ime ebe ahụ.
Ụmụikorobịa ha malitere pịawa ndị mmadụ ụtalị ma na-akwaghachị ha azụ, ka nke ahụ na-eme nsogbu ịda ada na ịzọ ịkwụ dịka igwe mmadụ na-ekwo dapụtara.”
Mana n’akụkụ nke ya, onye kanselọ na-anọchite anya Elele (ward 4) n’okpuru ọchịchị Ikwerre, Hon Emmanuel Amadi gọrọ agụgọ banyere ebubo na ahazighị ihe nke ọma; ma kọwaa na nsogbu ahụ bụ n’ihi ọgbaghara na esemokwu dapụtara n’etiti ụmụnwaanyị ndị nọ n’iro yaabụ ndị a kpọchibidoro geti.
Amadị gara n’ihu kwuo na ya bụ nsogbu metụtakwara ihe karịrị ụmụnwaanyị anọ nke gụnyere otu nwaanyị dị afọ iri iteghete na otu, bụ ndị e bugara ụlọọgwụ ozugbo. O wutere ya na Florenece nwụrụ n’ụlọọgwụ University of Port Harcourt Teaching Hospital. O kwuru sị; “Anyị kpebiri ịnọ na Vintage Farm wee kee ihe ndị ahụ n’ihi na o buru ibu, ọ bụ ebe ga-abata maka ike ihe.”