ỤLỌỌRỤ Local Government Pensions Board, Awka bụ ndị na-ahụ maka ndị ọrụ okpuru ọchịchị obodo na ndị nkuzi prịma lara ezumike nka nọ na Tọzdee izuụka gara aga ọnwa Mee dị n’abalị iri na atọ n’afọ a bụ 2020 wee mee emume nke ha na-eme ọnwa ọbụla iji nabata ma nye ndị lara ezumike nka ikike (capturing), ga-eme ka ha sonyere ibe ha na steeti Anambra.
Emume ahụ bụ nnọọ nke a haziri site n’usoro na ntụzi aka nke WHO, NCDC na gọọmenti steeti gbasara korona.Ọ bụ sọ ndị lara ezumike nka nọ na steeti ahụ ka a kpọrọ. Iji wee hụ na mmadụ anọghị ibe ya nso dịka iwu siri kwu ụlọọrụ ahụ ejizighị sọ ụlọezumezu ha kama ha tinyekwara ọtụtụ kanopi tinyekwara igwe na-ebulite ihe mmadụ na-ekwu ma mee ka a nụ ya nke ọma. E kewakwara ha ekewa nke pụtara na ha emekọtaghị ya ọnụ.
N’okwu ya, Odeakwụkwọ ụlọọrụ ahụ Local Government Pensions Board, Awka bụ Oriakụ Gloria Obiora-Ibezim (JP) toro mbọ gọọmenti steeti ahụ. O kelere Gọvanọ Obiano maka ezi ọchịchị ya. O kwuru sị:”Ana m ekele Chief Willie Obiano, Gọvanọ na-achị steeti Anambra maka ịhụnanya o nwere n’ebe ndị lara ezumike nka nọ.Ekele m na-agakwara Kọmishọna okpuru ọchịchị obodo Greg Obi na odeakwukwọ JAAC bụ Confidence Azodo. O bụladị ndị lara ezumikenka na-eweliri ha aka elu maka ha ga-amalite ribe ụgwọ ha ozugbo. E chebe mgbe korona lara, ọ ga-enye nsogbu.”
Obiora-Ibezim gara n’ihu kọwaa na ha gbasoro ntụziaka WHO, NCDC na nke gọọmenti steeti wee hazie emume ahụ n’ụzọ bụ ịgba. Ha ji ihe e ji eleta ọnọdụ ahụike mmadụ(infarred), ncha na ihe na-egbu nje bụ sanịtaịza wee mee ya iji gbochie ọrịa ọjọọ korona. E tinyekwara ụmụ ihe dị iche iche na-egbu nje n’ime mmiri na-agba agba ha jiri kwọ aka, ma mekwaa ka ha kwọọ aka ma tekwaa sanitaiza ugboro abụọ. E nyekwara ha akwa nkpuchi ihu n’efu iji gbanwoo nke ha jiri bịa ma nyekwa ha ihe ha ji megharị ọnụ.
Ode akwụkwọ ahụ kwuru sị:”E nyekwara ndị ọrụ anyị niile ihe a na-agba n’aka (glooves) na akwa mkpuchi ihu. Ihe ịdị a niile e mere bụ iji gbochie ikesa ọrịa korona. Ọ bụ ya ka anyị ịi ekele gọọmenti Anambra, maka iwetazu ihe niile a chọrọ.Anyị ji obi anyị niile ekele ya. Biko bunyere anyị ya ụkpa ekele.”
Otu nwaanyị n’ime ịdị ahụ lara ezumikenka n’ọrụ bụ Keziah
Chinyere Agba si Aguata kelere Chineke maka onyinye ahụike. O kwuru sị:”Oge a bụ oge ezumike. Ana m ekele Chineke maka ahụike.Ọ dị mma ịla ezumike, ya mere gọọmenti mere nke ọma.
Usoro e ji me emume a dị mma.Dịka e mere ka anyị ghara ịnọkọta ọnụ, anyị ji mmiri na-agba agba kwụọ aka ma tekwaa sanitaiza.N’ikpeazụ, ha gbanwere akwa mkpuchi ihu anyị site n’inye anyị nke ọhụrụ. Ihe niile gara nke ọma. Ana m ekele Gọvanọ na ndị ọrụ. Ebekuedike na-agba mbọ dị egwu!.”
N’akụkụ nke ya,onye ọzọ so na ndị lara ezumike, Cọmrade Arinze Innocent C. si Orumba North kwuru sị:”Obi bụ m aṅụrị dịka m ji ahụike laa ezumike. Ana m eweliri Gọvanọ Obiano aka n’elu maka icheta ndị lara ezumike ma mee ka ha sonyere ibe ha.”